Rehoboam we biarue Jerusalem, kpọkọta ulo Juda nile, na ebo Benjamin, orú nnù ndikom orú uzọ na abua na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, ndi nēbu agha, ibuso ulo Israel agha, iweghachiri Rehoboam nwa Solomon ala-eze. Okwu Chineke we rue Shemaia nti, bú onye nke Chineke, si, Gwa Rehoboam nwa Solomon, bú eze Juda, gwa kwa ulo nile nke Juda na Benjamin, gwa kwa ndi Israel fọduru, okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Unu arigola, unu ebuso-kwa-la umu-nne-unu, bú umu Israel, agha: laghachinu, nwoke ọ bula n'ulo-ya; n'ihi na n'ebe M'nọ ka ihe a siteworo. Ha we nu okwu Jehova, laghachi azu n'ulo-ha, dika okwu Jehova si di.
Gụọ I. NDI-EZE 12
Geere nke a ntị I. NDI-EZE 12
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. NDI-EZE 12:21-24
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị