N'ihi na nka bu ozi ahu unu nuru site na mbu, ka ayi hurita onwe-ayi n'anya: ọ bughi dika Ken si buru onye si n'ajọ onye ahu puta, we b͕ue nwa-nne-ya. Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka o b͕uru ya? N'ihi na ọlu-ya jọrọ njọ, ma ọlu nke nwa-nne-ya ziri ezi. Umu-nnam, ka ọ ghara iju unu anya ma ọ buru na uwa akpọ unu asì. Ayi onwe-ayi matara na ayi esitewo n'ọnwu ba na ndu, n'ihi na ayi nāhu umu-nna-ayi n'anya. Onye nādighi-ahu n'anya nānọgide n'ọnwu. Onye ọ bula nke nākpọ nwa-nna-ya asì bu ob͕u-madu: unu mata-kwa-ra na ọ dighi ob͕u-madu ọ bula nwere ndu ebighi-ebi nādigide nime ya. Nime nka ka ayi maworo ihu-n'anya, n'ihi na Ya onwe-ya tọb͕ọrọ ndu-Ya n'ihi ayi: ayi onwe-ayi ji kwa ugwọ itọb͕ọ ndu-ayi n'ihi umu-nna-ayi. Ma onye ọ bula nke nwere ihe uwa nka o ji biri, nke hu-kwa-ra nwa-nna-ya ka ọ nọ na nkpà, o we mechigide ya obi ebere ya, ìhunanya Chineke si aǹa digide nime ya? Umu-ntakirim, ka ayi ghara ihu n'anya n'okwu, ma-ọbu n'ire; kama ka ayi nāhu n'anya n'ọlu na ezi-okwu.
Gụọ I. JỌN 3
Geere nke a ntị I. JỌN 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. JỌN 3:11-18
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị