Ènweghi m onwem? àbughi m onye-ozi? àhughm Jisus Onye-nwe-ayi? ùnu onwe-unu abughi ọlum nime Onye-nwe-ayi? Ọ buru na abughm onye-ozi n'ebe ndi ọzọ nọ, ma otú ọ di, abum onye-ozi n'ebe unu nọ: n'ihi na akàrà nke ọlu onye-ozi nkem ka unu onwe-unu bu nime Onye-nwe-ayi. Ngọpum n'iru ndi nēkpem ikpé bu nka. Ọ̀ gābu na ayi enweghi ike iri ihe na iṅu ihe? Ọ̀ gābu na ayi enweghi ike ikuru nwunye, bú nwa-nna-nwanyi nime Kraist, jeghari, dika ndi-ozi fọduru nēme kwa, ha na umu-nne Onye-nwe-ayi, na Kifas? Ma-ọbu nání mu onwem na Banabas, àyi enweghi ike ighara ilu ọlu? Òle onye-agha nēwere ego-ọlu nke aka ya lua ọlu onye-agha mb͕e ọ bula? ònye nāku ubi-vine, nādighi-eri kwa nkpuru-ya? ma-ọbu ònye nāzù ìgwè aturu, nādighi-eri kwa ihe putara na miri-ara ìgwè aturu ahu? Ọ̀ gabu na anamekwu ihe ndia dika madu si ekwu? ma-ọbu ìwu Chineke adighi-ekwu kwa ihe ndia? N'ihi na edewo ya n'iwu Moses, si, Ekechila ọnu ehi mb͕e ọ nāzọcha ọka. Ọ̀ gābu na ehi bu ihe nēmetu Chineke n'obi? ma-ọbu Ò nēkwu ya n'ihi ayi onwe-ayi? E, n'ihi ayi ka edere ya n'akwukwọ nsọ: n'ihi na onye nālu ọlu ubi kwesiri ilu ọlu ubi n'olile-anya, onye nāzọcha ọka kwesiri kwa izọcha n'olile-anya na ọ gēketa. Ọ buru na ayi onwe-ayi ghara ihe nke Mọ Nsọ dika nkpuru nye unu, ọ̀ bu ihe uku ma ọ buru na ayi onwe-ayi gēwere ihe nke anu-aru unu dika ihe-ubi? Ọ buru na ndi ọzọ eketa ike a n'ebe unu nọ, àyi onwe-ayi adighi-eketa kari? Otú ọ di, ayi ejighi ike a nara ihe; kama ayi nānagide ihe nile, ka ayi we ghara ib͕ochi ozi ọma Kraist n'uzọ ọ bula. Ùnu amataghi na ndi nālu ọlu n'ulo uku Chineke nēri ihe si n'ulo uku Chineke puta, na ndi nānọ kwa n'iru ebe-ichu-àjà nēso ebe ichu-àjà ahu nēkekọ ihe? Ọbuná otú a ka Onye-nwe-ayi kara àkà ka ndi nēkwusa ozi ọma Ya si n'ozi ọma ahu di ndu. Ma mu onwem, ejighm ihe ọ bula n'ihe ndia nara ihe: edeghi m kwa ihe ndia n'akwukwọ ka ewe me otú a n'ebe m'nọ: n'ihi na ọ kam nma ka m'nwua, kari ka onye ọ bula me ka ihe-inya-isim buru ihe-efu. N'ihi na asi na anam-ezisa ozi ọma, enweghi m ihe inya isi; n'ihi na nkpà nākpam; n'ihi na ahuhu dirim, asi na ezisaghi m ozi ọma. N'ihi na asi na emem ihe a ebe m'nāchọ ime ya, enwerem ugwọ-ọlu: ma ọ buru na emem ya mb͕e m'nāchọghi ime ya, ewerewo ntukwasi-obi nye ọchichi-èzí-na-ulo n'akam. Gini kwa bu ugwọ-ọlum? Mb͕e m'nēzisa ozi ọma, ka m'we me ka ozi ọma ahu buru ihe ego nādighi nime ya, ka m'ghara ijizu ike nkem inara ihe n'ozi ọma ahu.