Anānu nọ̄ na ikwa-iko di n'etiti unu, aha ikwa-iko nke nādighi kwa ọbuná n'etiti ndi mba ọzọ, nke mere na otú onye n'etiti unu nwere nwunye nna-ya. Unu onwe-unu afuliwo kwa onwe-unu elu, unu erughi kwa újú kama nke ahu, ka ewe wepu onye ahu n'etiti unu, bú onye luru ọlu a. N'ihi na mu onwem n'ezie, ebe m'nānọghi n'etiti unu n'arum, ma anọm n'etiti unu na mọm, ekpewom onye ahu nke lutara nka otú a ikpé ọbuná ub͕u a, dika agāsi na anọm, n'aha nke Onye-nwe-ayi Jisus, mb͕e unu zukọrọ, mọm nēso kwa unu, ya na ike nke Onye-nwe-ayi Jisus, irara onye di otú a nye n'aka Setan ibibi anu-aru-ya, ka ewe zọputa mọ-ya n'ubọchi Onye-nwe-ayi Jisus. Ihe-inya-isi-unu adighi nma. Ùnu amataghi na ihe-iko-achicha di ntà nēko ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ dum? Sachapunu ihe-iko-achicha ochie, ka unu we buru ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ ọhu, dika unu bu achicha ekoghi-eko. N'ihi na achu-kwa-ra àjà-ngabiga-ayi, bú Kraist
Gụọ I. NDI KỌRINT 5
Geere nke a ntị I. NDI KỌRINT 5
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. NDI KỌRINT 5:1-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị