Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI KỌRINT 3:5-23

I. NDI KỌRINT 3:5-23 IGBOB

Gini kwa bu Apọlos? gini bu kwa Pọl? Ndi nēje ozi, ndi unu si n'aka-ha kwere; dika Onye-nwe-ayi nye-kwa-ra ha abua n'otù n'otù. Mu onwem kuru osisi, Apọlos kwọsara ya miri; ma ọ bu Chineke nēme ka ọ nāba uba. Ya mere onye nāku abughi ihe ọ bula, onye nākwọsa miri abughi kwa ihe ọ bula; kama Chineke, Onye nēme ka ọ nāba uba, bu ihe nile. Ma onye nāku na onye nākwọsa miri bu otù: ma ha abua n'otù n'otù gānata ugwọ-ọlu nke aka ha, onye ọ bula dika ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu si di. N'ihi na ayi bu ndi ha na Chineke nālukọ ọlu: unu bu ubi Chineke, buru kwa ulo Chineke nēwu. Dika amara Chineke nke enyerem si di, dika onye-isi-ọ̀kà nke mara ihe, atọrọm ntọ-ala; onye ọzọ nēwu kwa ulo n'elu ya. Ma ka onye ọ bula lezi anya otú ọ nēwu ulo n'elu ya. N'ihi na ọ dighi onye ọ bula puru itọ ntọ-ala ọzọ ma-ọbughi Nke atọworo, Nke bu Jisus Kraist. Ma ọ buru na onye ọ bula ewukwasi ọla-edo, ọla-ọcha, nkume di oké ọnu, osisi, ahihia, okporo-ọka, n'elu ntọ-ala ahu; agēme ka ọlu nke madu nile n'otù n'otù puta ìhè: n'ihi na ubọchi ahu gēgosi ya, n'ihi na agaje ikpughe ya n'ọku; ọku onwe-ya gānwa kwa ọlu madu nile n'otù n'otù, aha ọlu ọ bu. Ọ buru na ọlu onye ọ bula gādigide nke o wukwasiri ya, ọ gānata ugwọ-ọlu. Ọ buru na agērechapu ọlu onye ọ bula n'ọku, ọ gēyi iyì: ma agāzọputa ya onwe-ya; ma ọ bu dika onye azọputara n'ọku. Ùnu amataghi na unu bu ulo nsọ Chineke, Mọ nke Chineke bi kwa nime unu? Ọ buru na onye ọ bula emebi ulo nsọ Chineke, onye ahu ka Chineke gēmebi; n'ihi na ulo nsọ Chineke di nsọ, otú a ka unu di kwa. Ka onye ọ bula ghara ighọb͕u onwe-ya. Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye mara ihe n'etiti unu n'oge a, ya ghọ onye-nzuzu, ka o we ghọ onye mara ihe. N'ihi na amam-ihe nke uwa nka bu ihe-nzuzu n'ebe Chineke nọ. N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye nējide ndi mara ihe n'aghughọ-ha: ọzọ kwa, Onye-nwe-ayi mara ihe ndi mara ihe nātule n'obi-ha, na ha bu ihe-efu. Ya mere onye ọ bula anyala isi na madu. N'ihi na ihe nile bu nke unu; ma ọ bu Pọl, ma-ọbu Apọlos, ma-ọbu Kifas, ma-ọbu uwa, ma-ọbu ndu ma-ọbu ọnwu, ma-ọbu ihe di ub͕u a, ma-ọbu ihe gaje idi; ihe nile bu nke unu; ma unu onwe-unu bu ndi nke Kraist; ma Kraist bu nke Chineke.