Nime iwu Chineke ka edeworo ya, si, M'gēji madu ndi nāsu asusu di iche, ji kwa eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi di iche, gwa ndi nka okwu; ma ọbuná otú a ha agaghi-anu olum, ka Onye-nwe-ayi kwuru. Ya mere asusu di iche iche ndia, emere ka ha buru ihe-iriba-ama, ọ bughi nye ndi kwere ekwe, kama nye ndi nēkweghi ekwe: ma emere ibu-amuma ka ọ buru ihe-iriba-ama, ọ bughi nye ndi nēkweghi ekwe, kama nye ndi kwere ekwe. Ya mere asi na nzukọ Kraist dum biakọrọ n'otù ebe, asi kwa na ha nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma ọ buru na ndi nāmutaghi akwukwọ ma-ọbu ndi nēkweghi ekwe gābata, hà agaghi-asi na anya adighi unu nma? Ma asi na ha nile ebu amuma, ma ọ buru na onye nēkweghi ekwe ma-ọbu onye nāmutaghi akwukwọ gābata, ha nile nātu ya nmehie-ya n'anya, ha nile nēkpe kwa ya ikpé; ihe-nzuzo nile nke obi-ya aputa ìhè; ọ gēsi otú a da kpuchie iru-ya n'ala kpọ kwa isi ala nye Chineke, nēkwuputa na ọ bu ezie na Chineke nọ n'etiti unu.
Ọ̀ bu gini kwa, umu-nnam? mb͕e ọ bula unu biakọrọ n'otù ebe, unu nile n'otù n'otù ji abù ọma, ji ihe-ozizí, ji ihe-nkpughe, ji asusu di iche, ji isughari-asusu. Ka eme ihe nile ka ewe wuli madu nile elu dika ulo. Ọ buru na onye ọ bula eji asusu di iche nēkwu okwu, ka ọ buru ihe ra ka madu abua gēkwu, ma ka ha ghara ika madu atọ, ka ha kwu kwa n'usoro; ka otù onye sughari kwa: ma asi na ọ dighi onye nāsughari asusu nọ n'etiti unu, ya kpuchie ọnu-ya nime nzukọ Kraist; ya gwa onwe-ya na Chineke okwu. Ka ndi-amuma kwu kwa okwu, madu abua ma-ọbu madu atọ, ka ndi ọzọ tule kwa. Ma asi na ekpughere onye ọzọ nke nọdu n'akuku ya ihe, ka onye mbu kpuchie ọnu-ya. N'ihi na unu nile puru ibu amuma n'otù n'otù, ka madu nile we muta ihe, ka ewe kasi kwa madu nile obi; anēdo kwa mọ nile nke ndi-amuma n'okpuru ndi-amuma; n'ihi na Chineke abughi Chineke nke aghara, kama Ọ bu Chineke nke udo; otú ọ di nime nzukọ nile nke ndi nsọ.
Ka ndinyom-unu kpuchie ọnu-ha nime nzukọ-unu: n'ihi na ekweghi ha ka ha kwue okwu; kama ka ha do onwe-ha n'okpuru ike, dika iwu Chineke nēkwu kwa. Ọ buru kwa na ha nāchọ imuta ihe ọ bula, ka ha jua di nke aka ha n'ulo: n'ihi na ọ bu ihe-ihere ka nwanyi kwue okwu nime nzukọ Kraist. Ọ̀ gābu na okwu Chineke si n'ebe unu nọ puta? ma-ọbu ò ruru nání unu?
Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye-amuma, ma-ọbu onye nwere onyinye Mọ Nsọ, ya mazu ihe m'nēdegara unu n'akwukwọ, na ha bu ihe Onye-nwe-ayi nyere n'iwu. Ma ọ buru na onye ọ bula amaghi ihe ndia, ọ bu onye anāmaghi ama.
Ya mere, umu-nnam, werenu obi nānu ọku chọ ka unu bu amuma, unu eb͕ochi-kwa-la iji asusu di iche iche nēkwu okwu. Ma ka eme ihe nile n'uzọ di nma n'anya, na n'usoro.