Nāb͕asonu ihu-n'anya; otú ọ di, werenu obi nānu ọku chọ onyinye-amara nile nke Mọ Nsọ, ma nāchọkarinu ka unu bū amuma. N'ihi na onye ji asusu di iche nēkwu okwu, ọ dighi-agwa madu okwu, kama ọ nāgwa Chineke; n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nānu ihe ọ nēkwu; ma o ji mọ-ya nēkwu ihe-omimi. Ma onye nēbu amuma nāgwa madu okwu nke iwuli-elu dika ulo, na nke nkasi-obi, na nke ngugu-obi. Onye ji asusu di iche nēkwu okwu nēwuli onwe-ya elu dika ulo; ma onye nēbu amuma nēwuli nzukọ Kraist elu dika ulo. Otú ọ di, anamachọ ka unu nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma achọkaririm ka unu nēbu amuma: onye nēbu amuma ka kwa onye ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma-ọbughi na ọ nāsughari ya, ka ewe wuli nzukọ Kraist elu dika ulo.
Gụọ I. NDI KỌRINT 14
Geere nke a ntị I. NDI KỌRINT 14
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. NDI KỌRINT 14:1-5
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị