Ma okwu bayere onyinye nke Mọ Nsọ, umu-nnam, achọghi m ka unu ghara imara. Unu matara na mb͕e unu buri ndi mba ọzọ, anēdufu unu iso arusi ahu dara ob͕i, n'uzọ ọ bula anēdu unu. N'ihi nka emem ka unu mara na ọ dighi onye ọ bula nke nēkwu okwu nime Mọ nke Chineke nāsi, Jisus bu anathema; ọ dighi kwa onye ọ bula puru isi, Jisus bu Onye-nwe-ayi, ma-ọbughi nime Mọ Nsọ. Ma òkìkè nke onyinye-amara di, ma ọ bu otù Mọ Nsọ ahu. Òkìkè nke ije-ozi di kwa, otù Onye-nwe-ayi ahu di kwa. Òkìkè ihe alutaworo n'ọlu di kwa, ma ọ bu otù Chineke ahu, Onye nālusi ihe nile ike nime ayi nile. Ma anēnye madu nile n'otù n'otù n'etiti ayi ngosi nke Mọ Nsọ ka o we ba urù. N'ihi na anēsite n'aka Mọ Nsọ nye otù onye okwu amam-ihe; anēnye kwa onye ọzọ okwu ọmuma, di ka Mọ ahu nāchọ: nye kwa ibe-ya okwukwe, nime otù Mọ ahu; nye kwa onye ọzọ onyinye-amara nile ime ka aru madu di ike, nime otù Mọ nka; nye kwa onye ọzọ nluputa nke ọlu di ike; nye kwa onye ọzọ obubu-amuma; nye kwa onye ọzọ itule mọ di iche iche; nye kwa ibe-ya aha asusu di iche iche; nye kwa onye ọzọ isughari asusu: ma ihe ndia nile ka otù Mọ ahu nālusi ike, nání Ya, nēkère madu nile n'otù n'otù, ebe onye ọ bula nọ O kère ya dika Ọ nāchọ.
Gụọ I. NDI KỌRINT 12
Geere nke a ntị I. NDI KỌRINT 12
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. NDI KỌRINT 12:1-11
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị