Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI KỌRINT 11:1-15

I. NDI KỌRINT 11:1-15 IGBOB

Ghọnu ndi nēṅomim, dika mu onwem bu kwa onye nēṅomi Kraist. Ma anamaja unu na unu nēchetam n'ihe nile, jisi kwa ozizí ahu enyere n'aka-unu idebe ike, dika m'nyere ha n'aka-unu idebe. Ma anamachọ ka unu mata na Kraist bu isi nke nwoke ọ bula; nwoke bu kwa isi nke nwanyi; Chineke bu kwa isi nke Kraist. Nwoke ọ bula, mb͕e ọ nēkpe ekpere ma-ọbu mb͕e ọ nēbu amuma, ọ buru na o kpu ihe-nkpudo n'isi-ya, ọ nēme ka ihere me isi-ya. Ma nwanyi ọ bula, mb͕e ọ dighi-ekpudo ihe n'isi-ya n'ikpe ekpere ma-ọbu n'ibu amuma, ọ nēme ka ihere me isi-ya: n'ihi na ya na nwanyi nke akọpuworo isi-ya bu otù ihe ahu. N'ihi na asi na nwanyi ekpudoghi onwe-ya ihe n'isi, ka akpacha kwa agiri-isi-ya: ma asi na ọ buru nwanyi ihe-ihere ka akpacha agiri-isi-ya ma-ọbu ka akọpu isi-ya, ka ekpudo ya ihe n'isi. N'ihi na nwoke ekwesighi n'ezie ka ekpudo ya ihe n'isi, ebe ọ bu onyinyo na otuto nke Chineke: ma nwanyi bu otuto nke nwoke. N'ihi na nwoke esighi na nwanyi puta; kama nwanyi siri na nwoke puta: n'ihi na ekèghi kwa nwoke n'ihi nwanyi; kama ekère nwanyi n'ihi nwoke: n'ihi nka ka nwanyi kwesiri ikpu ihe-iriba-ama nke ike n'isi-ya, n'ihi ndi-mọ-ozi. Otú ọ di, nwanyi adighi ma nwoke anọghi ya, nwoke adighi kwa ma nwanyi anọghi ya, nime Onye-nwe-ayi. N'ihi na dika nwanyi siri na nwoke puta, otú a ka nwoke site-kwa-ra n'aka nwanyi; ma ihe nile si na Chineke puta. Tulenu nime onwe-unu: ọ̀ kwesiri ka nwanyi kpere Chineke ma ekpudoghi ya ihe n'isi? Ọbuná uzọ ekère madu, yà onwe-ya adighi-ezí unu, na, asi na nwoke nwere ogologo agiri-isi, na ọ buru ya ihe-ihere? Ma ọ buru na nwanyi nwere ogologo agiri-isi, ọ buru ya ihe otuto: n'ihi na enyewo ya agiri-isi-ya n'ọnọdu ihe ib͕okwasi n'aru.