Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. IHE EMERE 8

8
1Benjamin we mua Bela, bú ọkpara-ya, na Ashbel, bú nke-abua, na Ahara, bú nke-atọ; 2na Noha, bú nke-anọ, na Rafa, bú nke-ise. 3Bela we nwe umu-ndikom; Ada, na Gira, na Abaihud; 4na Abishua, na Neaman, na Ahoa; 5na Gira, na Shefufan, na Huram. 6Ndia bu kwa umu-ndikom Ihud: ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi bi na Geba, ha we me ka ha je biri na Manahat: 7na Neaman, na Ahaija, na Gira, onye ahu mere ka ha je biri n'ala ọzọ; ọ mua Uza na Ahaihud. 8Shaharaim we mua umu n'ọhia Moab, mb͕e o zilagasiri ha; Hushim na Baara bu ndinyom-ya. 9O we site na Hodesh, bú nwunye-ya, mua Jobab, na Zibia, na Misha, na Malkam; 10na Jeuz, na Shakia, na Miama. Ndia bu umu-ya ndikom, ha bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna. 11O site-kwa-ra na Hushim mua Abaitub na Elpaal. 12Umu-ndikom Elpaal; Iba, na Misham, na Shemed; onye ahu wuru Ono na Lod, na umu-obodo-ya: 13na Beria, na Shema; ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi bi n'Ajalon, ha onwe-ha mere ka ndi bi na Gat b͕alaga; 14na Ahio, na Shashak, na Jeremot; 15na Zebadaia, na Arad, na Eda; 16na Maikael, na Ishpa, na Joha, bú umu-ndikom Beria; 17na Zebadaia, na Meshulam, na Hizki, na Heba; 18na Ishmerai, na Izlia, na Jobab, bú umu-ndikom Elpaal; 19na Jakim, na Zikri, na Zabdi; 20na Elienai, na Ziletai, na Eliel; 21na Adaia, na Beraia, na Shimrat, bú umu-ndikom Shimai; 22na Ishpan, na Iba, na Eliel; 23na Abdon, na Zikri, na Henan; 24na Hananaia, na Ilam, na Antot a; 25na Ifdeia, na Penuel, bú umu-ndikom Shashak; 26na Shamsherai, na Sheharia, na Atalaia; 27na Jaareshia, na Elaija, na Zikri, bú umu-ndikom Jeroham. 28Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna n'osuso-ọmumu nile ha, ndi-isi. Ndia biri na Jerusalem. 29Ma nime Gibeon ka nna Gibeon biri, bú Jeiel, aha nwunye-ya bu Meaka: 30nwa-ya, bú ọkpara, bú Abdon, na Zua, na Kish, na Beal, na Nedab; 31na Gedoa, na Ahio, na Zeka. 32Miklot we mua Shimea. Ha onwe-ha we so kwa umu-nne-ha biri na Jerusalem, na ncherita-iru umu-nne-ha. 33Nea we mua Kish; Kish mua Sọl; Sọl mua Jonatan, na Malki-shua, na Abinadab, na Eshbeal. 34Nwa-nwoke Jonatan bu Merib-beal; Merib-beal we mua Maika. 35Umu-ndikom Maika kwa; Piton, na Melek, na Tarea, na Ehaz. 36Ehaz we mua Jehoada; Jehoada we mua Alemet, na Azmavet, na Zimri; Zimri we mua Moza: 37Moza mua Binea; Rafa bu nwa-ya, Eleasa nwa-ya, Azel nwa-ya: 38Azel nwere umu-ndikom isi, ndia bu kwa aha-ha; Azrikam, na Bokeru, na Ishmael, na Shearia, na Obadaia, na Henan. Ndia nile bu umu-ndikom Azel. 39Umu-ndikom Ishek nwa-nne-ya nwoke kwa; Ulam, bú ọkpara-ya, na Jeush, bú nke-abua, na Elifelet, bú nke-atọ. 40Umu Ulam we buru ndi-dike bu dìnkpà, ndi-ọb͕a-uta, ha nwe-kwa-ra ọtutu umu-ndikom, na umu umu, ọgu asa na iri. Ndia nile sitere n'umu Benjamin.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. IHE EMERE 8: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye