Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. IHE EMERE 5:1-17

I. IHE EMERE 5:1-17 IGBOB

Ma umu-ndikom Reuben ọkpara Israel, (n'ihi na onye ahu bu ọkpara; ma, n'ihi na o mere ute nna-ya ka ọ ghara idi nsọ, enyere umu Josef nwa Israel ọnọdu-ọkpara-ya; agaghi-ede kwa ya n'akwukwọ-osuso-ọmumu dika ọnọdu-ọkpara si di. N'ihi na Juda di ike n'etiti umu-nne-ya, onye-ndú we si nime ya puta; ma Josef nwere ọnọdu-ọkpara:) umu-ndikom Reuben ọkpara Israel; Hanok, na Palu, na Hezron, na Kami. Umu-ndikom Joel; Shemaia nwa-ya, Gog nwa-ya, Shimai nwa-ya; Maika nwa-ya, Reaia nwa-ya, Beal nwa-ya; Beera nwa-ya, onye Tilgat-pilnesa, bú eze Asiria, mere ka ọ je biri n'ala ọzọ: onye ahu bu onye-isi ndi Reuben nwere. Na umu-nne-ya ndikom dika ab͕uru nile ha si di, mb͕e edere akwukwọ-osuso-ọmumu nke osuso-ọmumu nile ha; onye-isi, bú Jeiel, na Zekaraia, na Bela nwa Azaz, nwa Shema, nwa Joel, onye ahu bi n'Aroea, we rue Nebo na Beal-meon: ma n'ọwuwa-anyanwu o biruru nbata ọzara, bú site n'osimiri Yufretis: n'ihi na anu-ulo-ha bara uba n'ala Gilead. Ma n'ubọchi Sọl ha busoro ndi Haga agha, ndi dara n'aka-ha: ha we biri n'ulo-ikwū-ha n'elu ala nile nke ọwuwa-anyanwu Gilead. Umu Gad biri kwa na ncherita-iru ha, n'ala Beshan rue Saleka: Joel, bú onye-isi, na Shafam, bú nke-abua, na Janai, na Shefat nime Beshan: na umu-nne-ha ndikom nke ulo nke ndi bu nna-ha; Maikael, na Meshulam, na Sheba, na Jorai, na Jakan, na Zia, na Iba, asa. Ndia bu umu-ndikom Abihail nwa Huri, nwa Jaroa, nwa Gilead, nwa Maikael, nwa Jeshishai, nwa Jahdo, nwa Buz; Ahi nwa Abdiel, nwa Guni, bú onye-isi ulo nke ndi bu nna-ha. Ha we biri na Gilead nime Beshan, na n'ime-obodo-ya, na n'ebe-ita-nri nile nke Sheron, rue ọpupu nile ha. Edere ha nile n'akwukwọ-osuso-ọmumu n'ubọchi Jotam, bú eze Juda, na n'ubọchi Jeroboam, bú eze Israel.