O rue, mb͕e ihe a gasiri, na agha biliri na Gezea nke ebusoro ndi Filistia: mb͕e ahu Sibekai onye Husha tib͕uru Sipai, nke sitere n'umu Rafa: ewe me ka ha ruru ala. Agha we di ọzọ ebusoro ndi Filistia; Elhanam nwa Jaia we tib͕ue Lahmi, bú nwa-nne Gọlaiat onye Gat, onye osisi ube-ya di ka oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà. Agha we di ọzọ na Gat, ma otù nwoke toro ogologo nọ n'ebe ahu, nkpisi aka-ya abua di isi isi, nkpisi ukwu-ya abua di kwa isi isi, ha nile di orú na anọ; ma amu-kwa-ra onye ahu nye Rafa. Ọ ta Israel uta, Jonatan nwa Shimea, bú nwa-nne Devid, we tib͕ue ya. Ndia ka amuru nye Rafa nime Gat; ha we da site n'aka Devid, na site n'aka ndi-orù-ya.
Gụọ I. IHE EMERE 20
Geere nke a ntị I. IHE EMERE 20
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. IHE EMERE 20:4-8
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo