Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. IHE EMERE 16:23-36

I. IHE EMERE 16:23-36 IGBOB

Bùkuenu Jehova abù, unu uwa nile; Nēzisanu ozi nzọputa-Ya site n'otù ubọchi rue ubọchi ọzọ. Kọsanu akukọ nsọpuru-Ya n'etiti mba nile, Akukọ oké ọlu-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche. N'ihi na Jehova di uku, buru kwa onye anēto nke-uku: Onye anātu egwu Ya ka Ọ bu kwa n'elu chi nile. N'ihi na chi nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu: Ma Jehova mere elu-igwe. Ebube na ima-nma di n'iru Ya: Ike na ọṅù di n'ebe-Ya. Nyenu Jehova, unu ab͕uru nke ndi nile di iche iche, Nyenu Jehova nsọpuru na ike. Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya: Butenu onyinye-inata-iru-ọma, bia n'iru Ya: Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ. Ka o nēb͕u unu nb͕u site n'iru Ya, unu elu-uwa nile: Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya. Ka elu-igwe ṅuria, ka uwa teghari kwa egwú ọṅù; Ka ha si kwa n'etiti mba nile, Jehova bu eze. Ka oké osimiri bib͕ọ, ya na ùjú-ya; Ka obi tọ ọhia utọ, ya na ihe nile nke di nime ya; Mb͕e ahu osisi nile nke oké ọhia gēti nkpu ọṅù n'iru Jehova, N'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe. Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Si-kwa-nu, Zọputa ayi, Chineke nzọputa-ayi, Chikọta kwa ayi, naputa ayi n'aka mba nile, Ikele aha nsọ Gi, Na inya isi n'otuto-Gi. Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Israel, bu, Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi. Ndi Israel nile we si, Amen, ha we to Jehova.