Devid we rigo, ya na Israel nile, rue Beala, rue Kiriat-jearim, nke Juda nwere, isi n'ebe ahu bugota ib͕e Chineke, bú Jehova, Onye nānọkwasi cherubim, nke akpọkwasiri Aha ahu. Ha we me ka ub͕ọ-ala ọhu būru ib͕e Chineke, ha we buputa ya n'ulo Abinadab: Uza na Ahio we nēdu ub͕ọ-ala ahu. Devid na Israel nile nēwere ike-ha nile gba egwú n'iru Chineke, were kwa abù, were kwa ubọ-akwara, na une, na egwú-otiti, na ájà, na opì. Ha we biarue ebe-nzọcha-ọka Kidon, Uza we setia aka-ya ijide ib͕e ahu; n'ihi na ehi nāb͕a ukwu. Iwe Jehova we di ọku megide Uza, O we tib͕ue ya, n'ihi na o setiri aka-ya metu ib͕e ahu: o we nwua n'ebe ahu n'iru Chineke. Iwe Devid we di ọku, n'ihi na Jehova tiwaputara ntiwa megide Uza: o we kpọ ebe ahu Perez-uza, rue ta. Devid we tua egwu Chineke n'ubọchi ahu, si, M'gēsi aṅa me ka ib͕e Chineke biakutem? Devid ewezugaghi kwa ib͕e ahu nye onwe-ya rue obodo Devid, ma o buzugara ya rue ulo Obed-edom, bú onye Gat. Ib͕e Chineke we nọdu n'ezi-na-ulo Obed-edom n'ulo-ya ọnwa atọ: Jehova we gọzie ulo Obed-edom na ihe nile o nwere.
Gụọ I. IHE EMERE 13
Geere nke a ntị I. IHE EMERE 13
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. IHE EMERE 13:6-14
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị