Devid na Israel nile we jerue Jerusalem (nke ahu bu Jebus); ma n'ebe ahu ka ndi Jebus, ndi bi n'ala ahu, nọ. Ndi bi na Jebus we si Devid, I gaghi-abata n'ebe a. Devid we were ebe ewusiri ike nke Zaion; nke ahu bu obodo Devid. Devid we si, Onye ọ bula nke buru uzọ tib͕u ndi Jebus gābu onye-isi na ọchi-agha. Joab nwa Zeruaia we buru uzọ rigo, o we buru onye-isi. Devid we biri n'ebe ahu ewusiri ike; n'ihi ya ka ha kpọrọ ya obodo Devid. O we wue obodo buruburu, site na Milo we rue buruburu ya: ma Joab mere ka obodo fọduru di ndu. Devid we nāga n'iru, nēje nādi uku; Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọye-kwa-ra ya.
Gụọ I. IHE EMERE 11
Geere nke a ntị I. IHE EMERE 11
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. IHE EMERE 11:4-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị