Solomọn nwere ubi vaịnị na Baal-Hamon, o nyefere ubi vaịnị ya nʼaka ndị ọrụ nlekọta. Onye ọbụla nʼime ha ga-eweta puku shekel ọlaọcha maka mkpụrụ ọ na-amịta. Ma ubi vaịnị m bụ nke aka m. Ana m enye ya onye m chọrọ inye. Puku ọlaọcha bụ nke Solomọn, ndị ọrụ ubi ga-enwetakwa narị ọlaọcha abụọ. Gị onye bi nʼubi a gbara ogige, gị na ndị enyi gị, kwere ka m nụ olu gị. Soro m ka anyị pụọ, onye m hụrụ nʼanya, bịakwute m dịka mgbada, maọbụ dịka nwa ele na-awụgharị nʼelu ugwu ebe ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ jupụtara.
Gụọ Abụ nke Abụ 8
Geere nke a ntị Abụ nke Abụ 8
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ nke Abụ 8:11-14
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo