Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ndị Rom 11:13-36

Ndị Rom 11:13-36 BIU

Ugbu a, unu ndị mba ọzọ, ka m na-agwa okwu. Ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ onyeozi nye ndị mba ọzọ, ana m enwe afọ ojuju nʼihi ije ozi m. Nʼihi na enwere m olileanya na, ma eleghị anya, apụrụ m isite nʼụzọ a kpasuo ekworo nʼime ụfọdụ ụmụnna m, ka e site nʼekworo ha zọpụta ụfọdụ nʼime ha. Ọ bụrụ na ọ bụ site nʼọjụjụ a jụrụ ha ka e siri mee ka ụwa dịrị na mma, gịnị ga-eme mgbe a nabatara ha? Ọ ga-adị ka i si nʼọnwụ bilie ọzọ, nwee ndụ ọzọ. Ebe ọ bụkwa na iberibe achịcha e jiri chụọ aja bụ ihe dị nsọ, mgbe ahụ, achịcha ahụ niile bụ ihe dị nsọ. Nʼihi na ọ bụrụ na mgbọrọgwụ osisi dị nsọ, otu a kwa, alaka ya ga-adịkwa nsọ. Ma a nyakapụrụ ụfọdụ alaka osisi a, werekwa unu bụ alaka osisi oliv ọhịa nyapagide nʼọnọdụ ha. Ya mere, unu esorola keta oke na ngọzị sitere na mgbọrọgwụ osisi oliv ahụ. Ma unu ekwesighị ịnya isi na a dọkapụrụ alaka ndị ọzọ were unu dochie nʼọnọdụ ha. Ihe unu na-aghaghị ịmata bụ nke a: unu bụ naanị alaka dị nʼosisi. Ọ bụghị unu na-ebu mgbọrọgwụ osisi, kama ọ bụ mgbọrọgwụ osisi na-ebu unu. Ma eleghị anya unu nwere ike kwuo, “Ma a nyakapụrụ alaka ụfọdụ e nwee ohere ebe a ga-anyapagide anyị.” Nke ahụ bụ eziokwu. Ma chetakwanụ na a nyakapụrụ ha nʼihi ekweghị ekwe ha, ma unu nọ naanị site nʼokwukwe. Ya mere anyala isi, kama na-atụ egwu. Nʼihi na ọ bụrụ na Chineke emereghị alaka nke osisi ahụ wapụtara nʼonwe ya ebere, ọ gaghị emekwara gị ebere. Ya mere, tulee obiọma na aka ike Chineke, aka ike nʼebe ndị dara ada nọ, ma obiọma nʼebe unu nọ, naanị mgbe unu na-anọgideghị nʼobi ebere ya, ma ọ bụghị ya, ọ ga-anyakapụkwa unu. Ma ọ bụrụ na ha anọgideghị na-ekweghị ekwe, a ga-anyapagidekwa ha nʼihi na Chineke pụrụ ịnyapagide ha ọzọ. Nʼihi na asị na e gbupụtara unu site nʼalaka osisi oliv ọhịa, nyapagide unu nʼosisi oliv ọma ahụ nʼụzọ na-abụghị usoro ndụ, gịnị kwanụ ga-egbochi ịnabata alaka ndị ya, bụ ndị si na ya, mee ka ha laghachi azụ nʼosisi oliv ahụ e si nyakapụ ha. Ụmụnna m, achọrọ m ka unu mata ihe omimi a, ka unu ghara ịnya isi. Nnupu isi ụfọdụ ụmụ Izrel agaghị adịgide kama ọ ga-adị ruo nʼoge ọnụọgụgụ ndị mba ọzọ a ga-anabata zuru. Mgbe ahụ, a ga-azọpụta Izrel niile. Dịka e dere ya, “Onye nzọpụta ga-esite na Zayọn bịa. Ọ ga-eme ka Jekọb site na ndụ asọpụrụghị Chineke chigharịa. Nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke dị nʼetiti mụ na ha, mgbe m wepụrụ mmehie ha niile.” Nʼihe banyere oziọma, ha bụ ndị iro nke Chineke nʼihi unu. Ma a bịa nʼihe gbasara nhọpụta, ha bụ ndị nke a hụrụ nʼanya nʼihi ndị nna nna ha. Nʼihi na enye anarakwa adịghị nʼonyinye nakwa ọkpụkpọ Chineke. Unu onwe unu ndị na-enupuru Chineke isi na mbụ, anatala ebere ya ugbu a, nʼihi nnupu isi ha. Otu a ka ọ dịkwa, ha bụ ndị na-enupu isi ugbu a ka ha nwe ike soro unu keta oke site nʼebere Chineke meere unu. Nʼihi na Chineke enyefeela onye ọbụla nʼaka nnupu isi, ka o si otu a gosi mmadụ niile obi ebere ya. Leenụ ka o si dị omimi bụ akụ ahụ Chineke nwere! Lee ka ịba ụba nke amamihe ya na ihe ọmụma ya siri dị ukwuu! Apụghị ịchọpụta ikpe ya niile, ụzọ ya niile bụkwa ihe apụghị ịchọpụta. “Onye maara uche Onyenwe anyị? Ma ọ bụ onye bụ onye ahụ na-enye ya ndụmọdụ?” “Onye burula ụzọ nye Chineke ihe, nke ga-eme ka Chineke kwụghachi ya?” Nʼihi na ihe niile sitere nʼime ya, sitekwa nʼaka ya, dịkwara ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi! Amen.