Aga m eji ilu malite okwu m, aga m ekwu ọtụtụ ihe omimi, ihe ndị sitere na mgbe ochie; ihe ndị anyị nụrụla, marakwa, ihe ndị nna nna anyị ha gwara anyị. Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a, kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu akụkọ ịdị ike ONYENWE ANYị, na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere. O nyere Jekọb iwu banyere ụkpụrụ ya, mekwaa ka iwu ahụ guzosie ike nʼIzrel, bụ nke ọ dọrọ nna nna anyị ha aka na ntị, ka ha kuziere ụmụ ha, ka ọgbọ na-eso ha nwee ike mụta ya, ọ bụladị ọgbọ nke a ka amụbeghị, ndị nke ga-agwakwa ha ụmụ ha.
Gụọ Abụ Ọma 78
Geere nke a ntị Abụ Ọma 78
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 78:2-6
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo