A maara Chineke nʼobodo Juda; aha ya dị ukwuu nʼobodo Izrel. Ụlọ ikwu ya dị na Salem, ebe obibi ya dị na Zayọn Ebe ahụ ka o tijisịrị àkụ niile na-egbu amụma, na ọta niile, na mma agha niile, na ngwa agha niile. Sela Ị jupụtara nʼìhè, ị dị oke ebube karịa ọtụtụ ugwu nke anụmanụ jupụtara. A pụnarịla ndị nwere obi ike ihe ha, ha na-arahụkwa ụra ikpeazụ ha; o nweghị otu onye nʼime ndị dike nʼagha ndị a pụrụ iweli aka ya abụọ elu. Nʼihi ịba mba gị, O Chineke nke Jekọb, ịnyịnya na ụgbọ agha na-anọ juu. Ọ bụ naanị gị ka e kwesiri ịtụ egwu. Onye pụrụ iguzo nʼihu gị mgbe i na-ewe iwe? I sitere nʼeluigwe mee ka a nụ olu ikpe ikpe gị. Ụwa tụkwara egwu, dere duu, mgbe gị, O Chineke, biliri ikpe ikpe, ịzọpụta ndị niile a na-akpagbu nʼala a. Sela Nʼezie, oke iwe gị megide ụmụ mmadụ na-ewetara gị otuto, ndị fọdụrụ mgbe oke iwe gị gabigasịrị, na-anọ juu. Kwenụ ONYENWE ANYị Chineke nkwa ma mezuokwa ha; ka ndị ala niile bụ agbataobi unu wetara onye ahụ e kwesiri ịtụ egwu onyinye dị iche iche. Ọ na-eweda ndị na-achị achị nʼala; ndị eze niile nke ụwa na-atụ ya egwu.
Gụọ Abụ Ọma 76
Geere nke a ntị Abụ Ọma 76
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 76:1-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo