Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 71:1-24

Abụ Ọma 71:1-24 BIU

ONYENWE ANYị, nʼime gị ka m gbabara izere ndụ; ekwela ka ihere mee m. Site nʼezi omume gị, gbapụta m, mee ka m nwere onwe m; tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m ma zọpụta m. Ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, ebe m nwere ike ịgbaba mgbe ọbụla; nye iwu maka nzọpụta m, nʼihi na ị bụ oke nkume m na ebe m e wusiri ike. O Chineke m, site nʼaka ndị ajọ omume na ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ, ndị afọ tara mmiri, gbapụta m. Nʼihi na gị onwe gị bụrịị olileanya m, Onyenwe m ONYENWE ANYị, ntụkwasị obi m site na mgbe m bụ nwantakịrị. Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi, site nʼoge amụrụ m; gị onwe gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Aga m anọgide na-eto gị. Adịla m ka ihe ama nye ọtụtụ mmadụ, ma ị bụ ebe mgbaba m siri ike. Ọnụ m jupụtara nʼotuto gị, ọ na-ekwupụta ịma mma gị ogologo ụbọchị niile. Agbakụtala m azụ mgbe m mere agadi; ahapụkwala m mgbe ike adịghịkwa m. Nʼihi na ndị iro m na-ekwu okwu megide m; ndị ahụ na-achọ igbu m na-agbarịta izu nzuzo. Ha na-asị, “Chineke agbakụtala ya azụ; chụọ ya ọsọ, jidekwa ya, nʼihi na o nweghị onye ọbụla ga-agbapụta ya.” O Chineke, anọla m ebe dị anya; O Chineke m, bịa ngwangwa nyere m aka. Ka e were ihere kpuchie ndị na-ebo m ebubo ụgha; ka ihere na nleda anya bụrụ ihe ga-ekpuchi ndị ahụ na-achọ imerụ m ahụ. Ma mụ onwe m ga-anọgide na-enwe olileanya mgbe niile; aga m eto gị mgbe niile karịa otu m toro gị na mbụ. Ọnụ m ga-ekwu banyere ezi omume gị na nzọpụta gị ogologo ụbọchị niile, ọ bụ ezie na-amaghị m ọtụtụ ya. Aga m abịa kwusaakwa ịdị ukwu ọrụ gị niile, Onyenwe m ONYENWE ANYị, aga m ekwusa ezi omume gị, e, naanị nke gị. O Chineke, site na mgbe m bụ nwantakịrị, i kuzielera m ihe, ruo taa, ana m ekwupụta banyere ọrụ ebube gị niile. O Chineke m, ọ bụladị mgbe m mere agadi, mgbe isi awọ juru m isi, ahapụla m, tutu ruo mgbe m ga-ekwupụta ike gị nye ọgbọ nke na-abịa, na ịdị ike gị nye ndị niile na-abịa nʼoge dị nʼihu. O Chineke, ezi omume gị na-eru nʼeluigwe, gị onye merela ọtụtụ ihe dị ukwu. O Chineke, onye dị ka gị? Nʼagbanyeghị na i meela ka m gabiga ọtụtụ nsogbu nke dị ilu, ị ga-atụte ndụ m ọzọ; site nʼebe dị omimi nke ụwa, ị ga-adọkpụpụta m ọzọ. Ị ga-eme m ka m dịrị ukwuu karịa ka m dị na mbụ. Ị ga-akasịkwa m obi ọzọ. O Chineke m, aga m eji ụbọ akwara too gị, nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị; aga m eji une bụkuo gị abụ otuto, gị Onye nsọ nke Izrel. Egbugbere ọnụ m ga-eti mkpu ọṅụ mgbe m na-abụku gị abụ otuto, mụ, onye ị gbapụtara. Ogologo ụbọchị niile, aga m ekwupụta ọrụ ezi omume gị niile, nʼihi na ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ, ka e tinyere nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara.