O Chineke, zọpụta m, nʼihi na mmiri abịaruola m nʼolu. Ana m emikpu nʼụrụrọ ebe dị omimi, e nwekwaghị ebe ịzọkwasị ụkwụ dị. Abịala m nʼebe mmiri dị omimi; uju mmiri na-achọkwa ikpuchigide m. Akpịrị akpọọla m nkụ; ike agwụla m ebe m na-akpọ oku maka enyemaka. Anya m agbaala ọchịchịrị ebe m na-ele anya Chineke. Ndị kpọrọ m asị nʼefu dị ukwuu karịa agịrị isi dị m nʼisi. Ndị na-achọ ịla ndụ m nʼiyi dị ukwuu, bụ ndị họọrọ ịbụ ndị iro m, mgbe ọ na-adịghị ihe ọbụla m mere ha. Ha nọgidesịrị m ike mee ka m nyeghachi ihe m na-ezughị nʼohi. Gị, Chineke, ị maara enweghị uche m niile; ikpe ọmụma m abụghị ihe zoro ezo nʼihu gị. Ekwela ka ihere mee ndị na-atụkwasị gị obi nʼihi m, O Onyenwe m, ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile; ka ndị na-achọ gị ghara ịbụ ndị a ga-eme ihe ihere nʼihi m, O Chineke nke Izrel. Ọ bụ nʼihi gị ka m na-anagide ịkwa emo, ihere ekpuchiela m ihu. Abụ m ọbịa nʼebe ụmụnna m nọ, nʼebe ụmụnne nọ, abụ m onye mba ọzọ. Nʼihi na ihe gbasara ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi, ịta ụta niile nke ndị na-akparị gị adakwasịla m. Mgbe m na-ebe akwa na-ebukwa ọnụ, ha kparịrị m nʼihi na m na-eme nke a. Mgbe m yikwasịrị uwe iru ụjụ m, a ghọrọ m ihe ha ji eme ihe ọchị. Ndị na-anọ ọnọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama, na-akwa m emo, na-akọ m ọnụ, abụ m isi abụ nke ndị na-aṅụbiga mmanya oke na-abụ. O ONYENWE ANYị, ana m akpọku gị nʼekpere, nʼoge ihuọma gị; na oke ịhụnanya gị, O Chineke m, zaa m nʼeziokwu nke nzọpụta gị.
Gụọ Abụ Ọma 69
Geere nke a ntị Abụ Ọma 69
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 69:1-13
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo