Ka Chineke meere anyị amara ma gọzie anyị, ma mee ka ihu ya chakwasị anyị, Sela Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa, marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile. Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; ka mmadụ niile too gị. Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ, nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ, na-edukwa mba niile nke ụwa. Sela Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; ka mmadụ niile too gị. Mgbe ahụ, ala ga-amịpụta ihe owuwe ubi ya, Chineke, onye bụ Chineke anyị, ga-agọzikwa anyị. Chineke ga-agọzi anyị, nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.
Gụọ Abụ Ọma 67
Geere nke a ntị Abụ Ọma 67
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 67:1-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị