O Chineke, meere m ebere, nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide; nʼihi oke ọmịiko gị, hichapụ njehie m niile. Sachapụ mmehie m niile, ma mee m ka m dị ọcha. Nʼihi na amaara m njehie m niile, mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile. Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide, mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị, nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu, na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe. Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m; bụrụkwa onye mmehie site nʼoge nne m tụrụ ime m. Nʼezie, ị na-achọ eziokwu nʼakụkụ niile zoro ezo; ị na-akụziri m amamihe nʼakụkụ niile zoro ezo. Were hisọp sachaa m, aga m adị ọcha; sachaa m ka m dị ọcha karịa snoo. Mee ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ; ka okpukpu ndị i gwepịara ṅụrịkwaa. Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị, hichapụkwa mmehie m niile. Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke, nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.
Gụọ Abụ Ọma 51
Geere nke a ntị Abụ Ọma 51
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 51:1-10
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo