Kụọnụ aka unu, unu mba niile; jiri iti mkpu ọṅụ tikuo Chineke. Nʼihi na ONYENWE ANYị bụ Chineke kachasị ihe niile elu. Ọ dị egwu! Ọ bụ eze ukwu na-achị ụwa niile. O wedara mba niile mee ka ha nọọ nʼokpuru anyị; ndị mmadụ niile nọ nʼokpuru ụkwụ anyị. Ọ họpụtaara anyị ihe nketa anyị, ihe ịnya isi nke Jekọb, onye ọ hụrụ nʼanya. Sela Chineke ewerela iti mkpu ọṅụ rigoro nʼeluigwe. ONYENWE ANYị ewerela olu opi ike rigoo. Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto; bụkuonụ eze anyị abụ otuto, bụọ abụ otuto. Nʼihi na Chineke anyị bụ eze ụwa niile. Jirinụ abụ too ya. Chineke bụ eze mba niile; ọ na-anọkwasị nʼocheeze ya dị nsọ na-achị mba niile. Ndị niile a ma ama na mba niile ezukọtaala, dịka ndị Chineke nke Ebraham, nʼihi na ndị eze niile dị nʼụwa bụ nke Chineke; ọ bụ onye e buliri elu nʼebe ọ dị ukwuu.
Gụọ Abụ Ọma 47
Geere nke a ntị Abụ Ọma 47
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 47:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo