Ndị na-eme ihe ọjọọ na-ebiri mmadụ ihe ma ha adịghị akwụghachi ya, ma onye ezi omume na-eme amara na-enye ndị ọzọ ihe o nwere. Ndị ONYENWE ANYị gọziri agọzi ga-eketa akụ nke ụwa, ma ndị ọ bụrụ ọnụ ka a ga-egbuchapụ. Ọ bụrụ na ONYENWE ANYị nwere mmasị na ndụ mmadụ, ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike; ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada, nʼihi na ONYENWE ANYị na-eji aka ya ejigide ya. Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi, ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume, maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri. Mgbe niile, ha na-eme amara jiri obi ha na-agbazinye ndị mmadụ ihe, ụmụ ha ga-abụ ngọzị. Site nʼihe ọjọọ pụọ, mee ezi ihe, mgbe ahụ, i ga-ebi nʼala a ruo mgbe ebighị ebi. ONYENWE ANYị na-ahụ onye ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya. Ọ gaghị ahapụkwa ndị ya kwesiri ntụkwasị obi. A ga-echebe ha ruo mgbe ebighị ebi, ma ụmụ ndị ajọ omume ka a ga-egbuchapụ; ndị ezi omume ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha, ha ga-ebikwa nʼime ya ruo mgbe ebighị ebi. Okwu amamihe na-esi nʼọnụ onye ezi omume pụta, ire ya na-ekwukwa ihe ziri ezi. Iwu Chineke ya dị ya nʼobi; nzọ ukwu ha adịghị agbụchapụ.
Gụọ Abụ Ọma 37
Geere nke a ntị Abụ Ọma 37
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 37:21-31
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị