Aga m eto gị, O ONYENWE ANYị, nʼihi na i sitere nʼebe dị omimi dọpụta m. I kweghị ka ndị iro m chịa m ọchị. O ONYENWE ANYị Chineke m, akpọkuru m gị, ka i nyere m aka, ị gwọkwara m. O ONYENWE ANYị, i si nʼala ili kpọpụta m, i mere ka m dịrị ndụ. Bụkuonụ ONYENWE ANYị abụ, unu ndị nsọ ya, toonu aha nsọ ya. Iwe ya adịghị adịgide tee anya, ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi! Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile, ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ.
Gụọ Abụ Ọma 30
Geere nke a ntị Abụ Ọma 30
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 30:1-5
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo