Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu; oke ehi dị ike nke Bashan gbara m gburugburu. Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịa asaghepụla ọnụ ha megide m. A wụpụla m dịka mmiri, ọkpụkpụ m niile apụkwaala nʼọnọdụ ha. Obi m agbazela dịka mmanụ, obi ịlọ mmiri ewerela ọnọdụ nʼime m. Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime. Ire m na-araparakwa m nʼọnụ, nʼihi na ị tọgbọrọ m nʼọnụ ọnwụ. Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu; otù ndị na-eme ihe ọjọọ agbaala m gburugburu, ha adupuola m aka m na ụkwụ m. A pụrụ ịgụta ọkpụkpụ m niile ọnụ; ndị mmadụ na-ele m anya na-emikwa ọnụ ọchị Ha na-eke uwe m nʼetiti ha, ha sitere nʼife nza kee uwe m. Ma gị, ONYENWE ANYị, anọla m ebe dị anya; gị Onye bụ ike m, mee ngwangwa bịa nyere m aka. Napụta ndụ m site na mma agha, site nʼike ụmụ nkịta, napụta ndụ m nke dị oke ọnụahịa. Gbapụta m site nʼọnụ ọdụm ndị a, zọpụta m site na mpi atụ ndị a.
Gụọ Abụ Ọma 22
Geere nke a ntị Abụ Ọma 22
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 22:12-21
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo