Ka ONYENWE ANYị zaa gị nʼụbọchị nsogbu gị; ka aha Chineke nke Jekọb chebe gị. Ya sitekwa nʼebe nsọ ya zitere gị inyeaka, ma site na Zayọn kwagide gị. Ya chetakwa aja niile ị chụrụ, ma nabata aja nsure ọkụ niile ị chụrụ nye ya. Sela Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ, mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma. Anyị ga-eti mkpu ọṅụ maka mmeri i meriri, buliekwa ọkọlọtọ anyị elu nʼaha Chineke anyị. Ka ONYENWE ANYị mezuo arịrịọ gị niile. Ugbu a, amaara m na ONYENWE ANYị na-azọpụta onye ya o tere mmanụ; ọ na-esite nʼebe nsọ ya nʼeluigwe jiri aka nri ya, zọpụta ma zakwaa ya. Ụfọdụ na-atụkwasị obi ha na ịnyịnya, ndị ọzọ nʼụgbọ agha; ma anyị na-atụkwasị aha ONYENWE ANYị, Chineke anyị, obi.
Gụọ Abụ Ọma 20
Geere nke a ntị Abụ Ọma 20
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 20:1-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo