O sitere nʼelu setịpụ aka ya,
jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile.
Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike,
bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m.
Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m,
ma ONYENWE ANYị bụrụ m ihe ndabere.
Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara,
ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ.
ONYENWE ANYị mesoro m dịka ezi omume m si dị;
ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị.
Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke ONYENWE ANYị,
ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ.
Iwu ya niile dị nʼihu m,
esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m.
Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya,
edebekwara m onwe m pụọ na mmehie.
ONYENWE ANYị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị,
dịka ịdị ọcha nke aka m abụọ si dị nʼanya ya.
Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi,
nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke.
Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha,
ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ.
Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi,
ma ị na-eme ka ndị nwere anya mpako dị ala.
Ọ bụ gị, ONYENWE ANYị, na-eme ka oriọna m na-enwu,
Chineke m na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè.
Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ,
sitekwa na Chineke m, apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla.
Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke,
okwu ọnụ ONYENWE ANYị bụ ihe a nụchara anụcha;
ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya.
Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị ONYENWE ANYị?
Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị?
Ọ bụ Chineke na-enye m ike,
na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke.
Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele;
Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu.
Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha,
ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz.
Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m,
aka nri gị na-akwagidekwa m,
inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu.
Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ,
ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ.