Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 18:1-32

Abụ Ọma 18:1-32 BIU

O ONYENWE ANYị, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m. ONYENWE ANYị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m. Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m, na oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya. Akpọkuru m ONYENWE ANYị, onye e kwesiri inye otuto, ọ zọpụtara m site nʼaka ndị iro m. Ụdọ niile nke ọnwụ kere m agbụ; ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m. Ụdọ nke ili kere m gburugburu, ọnya nke ọnwụ guzogidere m. Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m ONYENWE ANYị; etiri m mkpu akwa, kpọkuo Chineke m ka o nyere m aka; akwa m rutekwara ya ntị, o sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m. Ụwa mere mkpọtụ, maa jijiji, ntọala niile nke ugwu niile makwara jijiji, ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya. Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta, ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta; icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta. O kewara mbara eluigwe, rịdata; oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya. Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu, o feliri elu nʼelu nku nke ifufe. O mere ọchịchịrị ebe nzuzo ya, ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu, bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe. Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, igwe ojii ji mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe gabiga. ONYENWE ANYị sitere nʼeluigwe bigbọọ; olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda. Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa, o jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha. E kpughere ala ala nke oke osimiri, gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ, site nʼịba mba gị, O ONYENWE ANYị, na nkuume si gị nʼimi pụta. O sitere nʼelu setịpụ aka ya, jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile. Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike, bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m. Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m, ma ONYENWE ANYị bụrụ m ihe ndabere. Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara, ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ. ONYENWE ANYị mesoro m dịka ezi omume m si dị; ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị. Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke ONYENWE ANYị, ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ. Iwu ya niile dị nʼihu m, esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m. Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya, edebekwara m onwe m pụọ na mmehie. ONYENWE ANYị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị, dịka ịdị ọcha nke aka m abụọ si dị nʼanya ya. Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke. Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha, ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ. Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi, ma ị na-eme ka ndị nwere anya mpako dị ala. Ọ bụ gị, ONYENWE ANYị, na-eme ka oriọna m na-enwu, Chineke m na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè. Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ, sitekwa na Chineke m, apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla. Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke, okwu ọnụ ONYENWE ANYị bụ ihe a nụchara anụcha; ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya. Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị ONYENWE ANYị? Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị? Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke.