O ONYENWE ANYị, ị nyochaala m, ị makwaara m nke ọma Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ; site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile. Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m; ị mazukwara ụzọ m niile. O ONYENWE ANYị, ị maara ihe m gaje ikwu tupu m kwuo ya. Ị na-anọ m nʼihu, ma na-esokwa m nʼazụ, ị tụkwasịla m aka gị. Ihe ọmụma dị otu a dị oke omimi nye m, ọ dịkwa elu apụghị m iru ya. Ebee ka m ga-ezo onwe m si otu a zonarị Mmụọ gị? Ebeekwa ka m pụrụ ịgbaga ka m si nʼihu gị zoo onwe m? Ọ bụrụ na m arịgoro nʼeluigwe ị nọ nʼebe ahụ. Ọ bụrụkwa na m arịda zoo onwe m nʼala mmụọ, ị nọkwa nʼebe ahụ. Ọ bụrụ na m efepụ nʼisi ụtụtụ dịka nwa nnụnụ, felagaa nʼebe dị nnọọ anya nke oke osimiri, ọ bụladị nʼebe ahụ ka aka gị ga na-edu m aka nri gị ga-ejidesi m ike. Ọ bụrụ na m asị, “Nʼezie, ọchịchịrị ga-ekpuchi m ìhè ga-aghọ abalị gbaa m gburugburu.” Ọ bụladị ọchịchịrị agaghị abụ ọchịchịrị nʼebe ị nọ; abalị ga-enye ìhè dịka ehihie, nʼihi na ọchịchịrị dị ka ìhè nʼebe ị nọ.
Gụọ Abụ Ọma 139
Geere nke a ntị Abụ Ọma 139
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 139:1-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo