Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 119:73-176

Abụ Ọma 119:73-176 BIU

Aka gị kere m, kpụọkwa m; nye m nghọta ka m mụta iwu gị niile. Ka ndị na-atụ egwu gị ṅụrịa mgbe ha hụrụ m, nʼihi na olileanya m dị nʼokwu gị. O ONYENWE ANYị, amaara m na iwu gị niile ziri ezi, ọ bụkwa nʼikwesị ntụkwasị obi ka ị tara m ahụhụ. Ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ kasịe m obi, dịka nkwa i kwere ohu gị si dị. Ka ọmịiko gị bịakwasị m, ka m nwee ike dị ndụ, nʼihi na iwu gị na-amasị m. Ka ihere mee ndị mpako nʼihi ihe ọjọọ ha mere m na-enweghị ihe m mere; ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị. Ka ndị niile na-atụ egwu gị bịakwute m, ndị na-aghọta ụkpụrụ gị niile. Ka m were obi zuruoke na-agbaso ụkpụrụ gị niile, ka ihere ghara ime m. Mkpụrụobi m na-ada mba site nʼọchịchọ ya maka nzọpụta gị, ma olileanya m dị nʼokwu gị. Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nkwa gị; ana m asị, “Olee mgbe ị ga-akasị m obi?” Nʼagbanyeghị na adị m ka karama akpụkpọ nke dị nʼanwụrụ ọkụ, anaghị m echefu iwu gị niile. Ruo olee mgbe ka ohu gị ga-anọgide na-eche? Olee mgbe ka ị ga-ata ndị na-akpagbu m ahụhụ? Ndị mpako na-egwuru m olulu, bụ ihe nke na-adịghị ka iwu gị si dị. Iwu gị niile kwesiri ntụkwasị obi; nyere m aka, nʼihi na ndị mmadụ na-akpagbu m ma o nweghị ihe m mere ha. Ọ fọdụrụ ntakịrị ihe, ha gaara ala m nʼiyi, ma agbakụtaghị m ụkpụrụ gị azụ. Site nʼịhụnanya gị nke na-adịgide chebe ndụ m, ka m nwe ike rube isi nʼiwu nke ọnụ gị. O ONYENWE ANYị, okwu gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ọ na-eguzosi ike nʼeluigwe. Ikwesi ntụkwasị obi gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ; ọ bụ gị kere ụwa, ọ na-eguzosikwa ike. Ruo taa, iwu gị niile na-eguzosi ike, nʼihi na ihe niile na-ejere gị ozi. A sịkwarị na iwu gị anaghị amasị m, agaara m anwụ nʼime nsogbu m. Agaghị m echefu ụkpụrụ gị niile, nʼihi na ọ bụ ha ka i ji chebe ndụ m. Zọpụta m, nʼihi na abụ m nke gị; achọpụtala m ụkpụrụ gị niile. Ndị ajọ omume na-eche ịla m nʼiyi, ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị. Ana m ahụ nsọtụ ihe niile zuruoke, ma iwu gị niile enweghị nsọtụ. O, otu m si hụ iwu gị nʼanya! Ana m atụgharị uche na ya ogologo ụbọchị niile. Iwu gị na-eme ka amamihe m karịa nke ndị iro m, ha na-anọnyere m oge niile. Enwere m nghọta karịa ndị na-ezi m ihe, nʼihi na ana m atụgharịa uche nʼiwu gị niile. Enwere m nghọta karịa ndị okenye nʼihi na ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi. Ajụrụ m ajụ ije ije nʼụzọ ọjọọ ọbụla ka m nwee ike rubere okwu gị isi Ewezugaghị m onwe m nʼiwu gị niile, nʼihi na ọ bụ gị onwe gị ziri m ha. Lee ka okwu gị niile si atọ m ụtọ, ha dị ụtọ nʼọnụ m karịa mmanụ aṅụ! A na-enweta nghọta site nʼụkpụrụ gị niile; ya mere ana m akpọ ụzọ ọjọọ ọbụla asị. Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m bụrụkwa ìhè nʼụzọ m. Aṅụọla m iyi, mee ka o guzosie ike, na aga m agbaso iwu ezi omume gị niile. Ataala m ahụhụ nke ukwuu; chebe ndụ m, o ONYENWE ANYị, dịka okwu gị si dị. O ONYENWE ANYị, nabata otuto afọ ofufu niile nke si nʼọnụ m, kuziekwara m iwu gị niile. Mkpụrụobi m na-adị m nʼọbụaka m oge niile, ma echezọghị m iwu gị. Ndị ajọ omume esielera m ọnya, ma esitebeghị m nʼụkpụrụ gị kpafuo. Iwu gị niile bụ ihe nketa m ruo mgbe ebighị ebi; ha bụ ihe na-enye obi m ọṅụ. Obi m ekpebiela idebe ụkpụrụ gị ruo na ngwụcha. Ana m akpọ ndị na-enwe obi abụọ asị, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya. Ị bụ ebe mgbaba m na ọta m; olileanya m dị nʼokwu gị. Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-eme ihe ọjọọ, ka m nwee ike idebe iwu niile nke Chineke m! Gbaa m ume dịka nkwa gị si dị, aga m adịkwa ndụ; ekwekwala ka olileanya m daa. Kwagide m, aga m abụ onye a gbapụtara; aga m anọgide na-asọpụrụ iwu gị niile. Ị na-ajụ ndị niile na-adịghị edebe iwu gị, nzube aghụghọ ha niile bụ ihe na-enweghị isi. Ị na-ekpochapụ ndị ajọ omume dịka unyi a na-ekpofu ekpofu; nʼihi ya, ahụrụ m ụkpụrụ gị niile nʼanya. Anụ ahụ m na-ama jijiji nʼihi ịtụ egwu gị; ana m eguzo nʼoke egwu nʼihi iwu gị niile. Emeela m ihe dị mma na ihe ziri ezi; ahapụkwala m nʼaka ndị na-emegbu m. Kwee ohu gị nkwa na ị ga-elekọta ya; ekwela ka ndị mpako kpagbuo m. Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nzọpụta gị ebe m na-ele anya nkwa gị ziri ezi. Biko mesoo ohu gị mmeso dịka ịhụnanya gị si dị ma kuziekwara m ụkpụrụ gị niile. Abụ m ohu gị, nye m nghọta, ka m nwee ike mara ụkpụrụ gị niile. O ONYENWE ANYị, oge eruola mgbe ị ga-arụ ọrụ, nʼihi na a na-emebi iwu gị. Nʼihi na ahụrụ m iwu gị niile nʼanya karịa ọlaedo, e karịa ọlaedo a nụchara anụcha, nʼihi na m na-ahụta ụkpụrụ gị niile ka ihe ziri ezi, akpọrọ m ụzọ niile na-ezighị ezi asị. Iwu gị niile dị ịtụnanya; ya mere, ana m erubere ha isi. Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè; ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe. Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike, na-achọsi iwu gị niile ike. Chee m ihu, meere m ebere, dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere. Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị; ekwela ka mmehie chịa m. Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m, ka m nwee ike debe iwu gị. Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị. Kuziere m ụkpụrụ gị niile. Anya mmiri akwa na-agba m nke ukwuu nʼihi na ndị mmadụ adịghị erube isi nye iwu gị. O ONYENWE ANYị, ị bụ onye ezi omume, iwu gị niile zikwara ezi. Ụkpụrụ gị niile ziri ezi; ha kwesiri ntụkwasị obi. Nʼihi na ndị iro m na-elefu okwu gị anya, ịnụ ọkụ nʼobi m na-ada mba. Nkwa gị niile bụ ihe enyochara nke ọma, ohu gị na-ahụkwa ha nʼanya. Ọ bụ ezie na m bụ onye dị ala, na onye a na-eleda anya, ma adịghị m eleda ụkpụrụ gị niile anya. Ezi omume gị na-adị ruo mgbe ebighị ebi. Iwu gị niile bụkwa eziokwu. Nsogbu na ihe mgbu adakwasịla m, ma iwu gị niile bụ ihe na-amasị m. Iwu gị niile bụ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi; nye m nghọta, ka m nwe ike dị ndụ. Eji m obi m niile na-akpọ oku; zaa m o ONYENWE ANYị, aga m erubekwa isi nye ụkpụrụ gị niile. Ana m akpọku gị; zọpụta m aga m erube isi nye ụkpụrụ gị niile. Tupu chị na-abọ, ana m ebili, na-akwa akwa maka enyemaka; olileanya m dị nʼokwu gị. Ana m amụ anya abalị nʼelu ihe ndina m, nʼihi ịtụgharị uche na nkwa gị niile. Nụrụ olu m dịka ịhụnanya gị si dị; chebe ndụ m, o ONYENWE ANYị, dịka iwu gị niile si dị. Ndị na-atụpụta atụmatụ ọjọọ nọ nso ma ha nọ iwu gị niile nʼebe dị anya. Ma ị nọ nso, ONYENWE ANYị; ihe niile i nyere nʼiwu bụ eziokwu. Site na mgbe ochie ka m mụtara site nʼụkpụrụ gị, na i mere ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. Ledata anya ka ị hụ ịta ahụhụ m ma gbapụta m, nʼihi na echefughị m iwu gị. Kpepụta m, gbapụta m, chebe ndụ m dịka nkwa gị si dị. Nzọpụta dị anya nʼebe ndị na-eme ihe ọjọọ nọ, nʼihi na ha anaghị agbaso ụkpụrụ gị niile. O ONYENWE ANYị, ọmịiko gị dị ukwuu; chebe ndụ m dịka iwu gị niile si dị. Ndị iro m na ndị na-akpagbu m dị ọtụtụ, ma aga m anọgide na-edebe iwu gị. Ana m asọ ndị niile na-enweghị okwukwe nʼime gị oyi, nʼihi na ha anaghị erubere okwu gị isi. Lee ka m si hụ ụkpụrụ gị niile nʼanya; chebe ndụ m, o ONYENWE ANYị, dịka ịhụnanya gị si dị. Okwu gị niile bụ eziokwu; iwu gị niile ziri ezi na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ndịisi na-emegbu m na-enweghị ihe m mere, ma obi m na-ama jijiji nʼihi okwu gị. Ana m aṅụrị ọṅụ nʼime nkwa gị dịka onye chọtara ọtụtụ ihe nkwata nʼagha. Akpọrọ m okwu ụgha asị, ọ bụkwa ihe arụ nʼebe m nọ, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya. Aga m eto gị ugboro asaa nʼụbọchị, nʼihi iwu gị ziri ezi. Ndị hụrụ iwu gị nʼanya nwere udo dị ukwuu, ọ dịghị ihe ga-eme ka ha sụọ ngọngọ. Ana m echere nzọpụta gị, o ONYENWE ANYị, na-agbasokwa iwu gị niile. Ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi nʼihi na m hụrụ ha nʼanya nke ukwuu. Ana m erubere ụkpụrụ na iwu gị niile isi, nʼihi na ị maara ụzọ m niile. Ka akwa m ruo gị ntị, o ONYENWE ANYị; nye m nghọta dịka okwu gị si dị. Ka arịrịọ m ruo gị ntị; gbapụta m dịka nkwa gị si dị. Ka ọnụ m jupụta nʼotuto, nʼihi na ị na-ezi m iwu gị niile. Ka m jiri ire m bụọ abụ banyere okwu gị, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi. Nọọ na njikere oge niile inyere m aka, nʼihi na ahọrọla m ụkpụrụ gị niile. Ana m ele anya nzọpụta gị, o ONYENWE ANYị, iwu gị bụ ihe na-amasị m. Kwere ka m dịrị ndụ ka m nwee ike ito gị, ka iwu gị niile gbaa m ume. Akpafuola m dịka atụrụ nke furu efu, chọọ ohu gị, nʼihi na echefubeghị m iwu gị niile.