Iwu gị niile dị ịtụnanya;
ya mere, ana m erubere ha isi.
Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè;
ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe.
Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike,
na-achọsi iwu gị niile ike.
Chee m ihu, meere m ebere,
dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere.
Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị;
ekwela ka mmehie chịa m.
Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m,
ka m nwee ike debe iwu gị.
Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị.
Kuziere m ụkpụrụ gị niile.
Anya mmiri akwa na-agba m nke ukwuu
nʼihi na ndị mmadụ adịghị erube isi nye iwu gị.
O ONYENWE ANYị, ị bụ onye ezi omume,
iwu gị niile zikwara ezi.
Ụkpụrụ gị niile ziri ezi;
ha kwesiri ntụkwasị obi.
Nʼihi na ndị iro m na-elefu okwu gị anya,
ịnụ ọkụ nʼobi m na-ada mba.
Nkwa gị niile bụ ihe enyochara nke ọma,
ohu gị na-ahụkwa ha nʼanya.
Ọ bụ ezie na m bụ onye dị ala, na onye a na-eleda anya,
ma adịghị m eleda ụkpụrụ gị niile anya.
Ezi omume gị na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
Iwu gị niile bụkwa eziokwu.
Nsogbu na ihe mgbu adakwasịla m,
ma iwu gị niile bụ ihe na-amasị m.
Iwu gị niile bụ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi;
nye m nghọta, ka m nwe ike dị ndụ.
Eji m obi m niile na-akpọ oku; zaa m o ONYENWE ANYị,
aga m erubekwa isi nye ụkpụrụ gị niile.
Ana m akpọku gị; zọpụta m
aga m erube isi nye ụkpụrụ gị niile.
Tupu chị na-abọ, ana m ebili, na-akwa akwa maka enyemaka;
olileanya m dị nʼokwu gị.
Ana m amụ anya abalị nʼelu ihe ndina m,
nʼihi ịtụgharị uche na nkwa gị niile.
Nụrụ olu m dịka ịhụnanya gị si dị;
chebe ndụ m, o ONYENWE ANYị, dịka iwu gị niile si dị.
Ndị na-atụpụta atụmatụ ọjọọ nọ nso
ma ha nọ iwu gị niile nʼebe dị anya.
Ma ị nọ nso, ONYENWE ANYị;
ihe niile i nyere nʼiwu bụ eziokwu.
Site na mgbe ochie ka m mụtara site nʼụkpụrụ gị,
na i mere ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
Ledata anya ka ị hụ ịta ahụhụ m ma gbapụta m,
nʼihi na echefughị m iwu gị.
Kpepụta m, gbapụta m,
chebe ndụ m dịka nkwa gị si dị.
Nzọpụta dị anya nʼebe ndị na-eme ihe ọjọọ nọ,
nʼihi na ha anaghị agbaso ụkpụrụ gị niile.
O ONYENWE ANYị, ọmịiko gị dị ukwuu;
chebe ndụ m dịka iwu gị niile si dị.
Ndị iro m na ndị na-akpagbu m dị ọtụtụ,
ma aga m anọgide na-edebe iwu gị.
Ana m asọ ndị niile na-enweghị okwukwe nʼime gị oyi,
nʼihi na ha anaghị erubere okwu gị isi.
Lee ka m si hụ ụkpụrụ gị niile nʼanya;
chebe ndụ m, o ONYENWE ANYị, dịka ịhụnanya gị si dị.
Okwu gị niile bụ eziokwu;
iwu gị niile ziri ezi na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Ndịisi na-emegbu m na-enweghị ihe m mere,
ma obi m na-ama jijiji nʼihi okwu gị.
Ana m aṅụrị ọṅụ nʼime nkwa gị
dịka onye chọtara ọtụtụ ihe nkwata nʼagha.
Akpọrọ m okwu ụgha asị, ọ bụkwa ihe arụ nʼebe m nọ,
ma ahụrụ m iwu gị nʼanya.
Aga m eto gị ugboro asaa nʼụbọchị,
nʼihi iwu gị ziri ezi.
Ndị hụrụ iwu gị nʼanya nwere udo dị ukwuu,
ọ dịghị ihe ga-eme ka ha sụọ ngọngọ.
Ana m echere nzọpụta gị, o ONYENWE ANYị,
na-agbasokwa iwu gị niile.
Ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi
nʼihi na m hụrụ ha nʼanya nke ukwuu.
Ana m erubere ụkpụrụ na iwu gị niile isi,
nʼihi na ị maara ụzọ m niile.
Ka akwa m ruo gị ntị, o ONYENWE ANYị;
nye m nghọta dịka okwu gị si dị.
Ka arịrịọ m ruo gị ntị;
gbapụta m dịka nkwa gị si dị.
Ka ọnụ m jupụta nʼotuto,
nʼihi na ị na-ezi m iwu gị niile.
Ka m jiri ire m bụọ abụ banyere okwu gị,
nʼihi na iwu gị niile ziri ezi.
Nọọ na njikere oge niile inyere m aka,
nʼihi na ahọrọla m ụkpụrụ gị niile.
Ana m ele anya nzọpụta gị, o ONYENWE ANYị,
iwu gị bụ ihe na-amasị m.
Kwere ka m dịrị ndụ ka m nwee ike ito gị,
ka iwu gị niile gbaa m ume.
Akpafuola m dịka atụrụ nke furu efu,
chọọ ohu gị,
nʼihi na echefubeghị m iwu gị niile.