Iwu gị niile dị ịtụnanya; ya mere, ana m erubere ha isi. Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè; ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe. Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike, na-achọsi iwu gị niile ike. Chee m ihu, meere m ebere, dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere. Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị; ekwela ka mmehie chịa m. Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m, ka m nwee ike debe iwu gị. Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị. Kuziere m ụkpụrụ gị niile. Anya mmiri akwa na-agba m nke ukwuu nʼihi na ndị mmadụ adịghị erube isi nye iwu gị. O ONYENWE ANYị, ị bụ onye ezi omume, iwu gị niile zikwara ezi. Ụkpụrụ gị niile ziri ezi; ha kwesiri ntụkwasị obi. Nʼihi na ndị iro m na-elefu okwu gị anya, ịnụ ọkụ nʼobi m na-ada mba. Nkwa gị niile bụ ihe enyochara nke ọma, ohu gị na-ahụkwa ha nʼanya. Ọ bụ ezie na m bụ onye dị ala, na onye a na-eleda anya, ma adịghị m eleda ụkpụrụ gị niile anya. Ezi omume gị na-adị ruo mgbe ebighị ebi. Iwu gị niile bụkwa eziokwu. Nsogbu na ihe mgbu adakwasịla m, ma iwu gị niile bụ ihe na-amasị m. Iwu gị niile bụ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi; nye m nghọta, ka m nwe ike dị ndụ. Eji m obi m niile na-akpọ oku; zaa m o ONYENWE ANYị, aga m erubekwa isi nye ụkpụrụ gị niile. Ana m akpọku gị; zọpụta m aga m erube isi nye ụkpụrụ gị niile. Tupu chị na-abọ, ana m ebili, na-akwa akwa maka enyemaka; olileanya m dị nʼokwu gị. Ana m amụ anya abalị nʼelu ihe ndina m, nʼihi ịtụgharị uche na nkwa gị niile. Nụrụ olu m dịka ịhụnanya gị si dị; chebe ndụ m, o ONYENWE ANYị, dịka iwu gị niile si dị. Ndị na-atụpụta atụmatụ ọjọọ nọ nso ma ha nọ iwu gị niile nʼebe dị anya. Ma ị nọ nso, ONYENWE ANYị; ihe niile i nyere nʼiwu bụ eziokwu. Site na mgbe ochie ka m mụtara site nʼụkpụrụ gị, na i mere ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
Gụọ Abụ Ọma 119
Geere nke a ntị Abụ Ọma 119
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 119:129-152
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo