Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 119:1-32

Abụ Ọma 119:1-32 BIU

Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta ọbụla, ndị na-ejegharị dịka iwu ONYENWE ANYị si dị. Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike. Ha adịghị eme ihe ọjọọ ọbụla; ha na-ejegharị nʼụzọ ya niile. I doola ụkpụrụ ndị a ga-erubekwara isi. Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na m anọgidesie ike na-erube isi nye iwu gị niile! Mgbe ahụ, ihere agaghị eme m mgbe m tulere uche nʼiwu gị niile. Aga m eji obi ziri ezi too gị dịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi. Aga m erubere iwu gị niile isi; biko ahapụkwala m. Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ? Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị. Eji m obi m niile na-achọsi gị ike. Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu. Ezoola m okwu gị niile nʼobi m, igbochi m imehie imegide gị. Otuto dịrị gị, o ONYENWE ANYị; kuziere m iwu gị niile. Aga m eji egbugbere ọnụ m gụgharịa iwu niile nke si nʼọnụ gị. Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niile dịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba. Ana m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị na-atulekwa uche nʼụzọ gị niile. Iwu gị na-amasị m; agaghị m elefu okwu gị anya. Meere ohu gị ihe ọma, ka m nwe ike dị ndụ; aga m erubere okwu gị isi. Kpughee anya m abụọ ka m hụ oke ihe ebube niile dị iche iche dị nʼime okwu gị. Abụ m onye ọbịa nʼelu ụwa; ezonarịla m iwu gị niile. Nʼoge niile, ihe banyere iwu gị niile na-agụ mkpụrụobi m agụụ. Ị na-abara ndị mpako mba, ha bụ ndị a bụrụ ọnụ na ndị na-anaghị agbaso iwu gị. Site nʼebe m nọ wepụ ịchị ọchị na nlelị, nʼihi na m na-edebe ụkpụrụ gị niile. Nʼagbanyeghị na ndịisi nọkọrọ na-ekwulu m, ohu gị ga-atụgharị uche nʼiwu gị. Ụkpụrụ gị niile bụ ihe na-amasị m; ha bụ ndị ndụmọdụ m. Mkpụrụobi m na-arapara nʼuzuzu; kpọghachite ndụ m dịka okwu gị si dị. Akọwaara m gị ụzọ m niile, ị zakwara m; ugbu a, kuziere m iwu gị. Mee ka m ghọta ozizi ụkpụrụ gị; ka m nwe ike tụgharịa uche nʼọrụ ebube gị niile. Iru ụjụ emeela ka mkpụrụobi m daa mba; gbaa m ume dịka okwu gị si dị. Chebe m pụọ nʼụzọ aghụghọ niile; site nʼiwu gị meere m amara. Ahọrọla m ụzọ ikwesi ntụkwasị obi; e kpebiela m idebe obi m nʼiwu gị niile. O ONYENWE ANYị, ana m ejigidesi iwu gị niile aka ike; ekwela ka ihere mee m. Aga m agbaso iwu gị niile nʼihi na i meela ka obi m nwere onwe ya.