Emesịa, ha ledara ala ọma ahụ anya, ha ekwenyeghị na nkwa ya. Ha tamuru ntamu nʼime ụlọ ikwu ha; ha erubekwaghị isi nye ONYENWE ANYị. Nʼihi nke a, o weliri aka ya elu ṅụọrọ ha iyi na ọ ga-eme ka ha niile nwụọ nʼọzara, mee ka agbụrụ ha daa nʼetiti mba dị iche iche, ma chụsasịa ha nʼala niile. Ha dịnyeere ndị na-efe arụsị Baal nke Peoa, riekwa ihe e ji chụọrọ chi na-enweghị ndụ aja; ha sitere nʼajọ omume ha kpasuo ONYENWE ANYị iwe, nke mere ka ọrịa na-efe efe dakwasị ha. Ma Finehaz guzoro ọtọ, mee ihe ziri ezi, ọrịa ahụ na-efe efe kwụsịkwara. A gụnyere nke a dịka ezi omume nye ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Nʼakụkụ mmiri Meriba, ha kpasuru ONYENWE ANYị iwe, nʼihi ha, nsogbu dakwasịrị Mosis; nʼihi na ha nupuru isi megide Mmụọ nke Chineke, Mosis kwuru okwu, na-echeghị echiche banyere ihe ọ na-ekwu. Ha egbuchapụghị mba niile bi nʼala ahụ dịka ONYENWE ANYị dọrọ ha aka na ntị ka ha mee. Kama ha gwakọtara onwe ha na mba niile nke ala ahụ, site otu a, mụta ime ka ha na-eme.
Gụọ Abụ Ọma 106
Geere nke a ntị Abụ Ọma 106
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 106:24-35
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo