Toonu ONYENWE ANYị. Keleenụ ONYENWE ANYị nʼihi na ọ dị mma; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Onye pụrụ ikwupụtasịcha ihe ukwu niile nke ONYENWE ANYị na-arụ maọbụ kwupụta otuto ya niile? Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ikpe ziri ezi, ndị ahụ na-eme ezi ihe mgbe niile. O ONYENWE ANYị, cheta m mgbe ị ga-egosi ndị gị ihuọma, bịa leta m, mgbe ị na-azọpụta ha, ka m soro keta oke na ngọzị ndị gị ị họpụtara, ka m keta oke nʼọṅụ ahụ dịrị mba gị sorokwa ihe nketa gị nye otuto. Anyị emehiela, dịka nna nna anyị ha mehiere; anyị emeela ihe ọjọọ, rụọkwa ọrụ ajọ omume. Mgbe nna nna anyị ha nọ nʼIjipt, ha echeghị uche banyere ọrụ ebube gị niile; ha echetakwaghị ịba ụba nke ebere gị niile, kama ha nupuru isi nʼakụkụ oke osimiri ahụ, bụ Osimiri Uhie. Ma ọ zọpụtara ha nʼihi aha ya, ime ka a mara ike ya dị ukwuu. Ọ baara Osimiri Uhie mba, ọ tachaa; o dufere ndị ya site nʼebe dị omimi gafee dịka ọ bụ ọzara. Ọ zọpụtara ha site nʼaka ndị kpọrọ ha asị; gbapụtakwa ha site nʼaka ndị iro ha. Mmiri ahụ riri ndị iro ha niile; ọ dịghị otu onye nʼime ha fọdụrụ. Mgbe ahụ, ha kweere okwu gị niile, ma bụkuo gị abụ otuto.
Gụọ Abụ Ọma 106
Geere nke a ntị Abụ Ọma 106
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 106:1-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo