Nyenụ ONYENWE ANYị otuto, kwupụtakwa aha ya. Meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ. Bụkuo ya abụ, bụkuo ya abụ otuto; kwupụtanụ ọrụ ihe ịrịbama ya niile. Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ ONYENWE ANYị ṅụrịa. Na-achọnụ ONYENWE ANYị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile. Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ, ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile si nʼọnụ ya pụta, unu ụmụ ụmụ Ebraham, bụ ohu ya, unu ụmụ ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara. Ya onwe ya bụ ONYENWE ANYị Chineke anyị; ikpe ya dị nʼụwa niile. Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi, bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ, ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik. O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ, ma nʼebe Izrel nọ, dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi: “Aga m enye gị ala Kenan dịka oke i ga-eketa.”
Gụọ Abụ Ọma 105
Geere nke a ntị Abụ Ọma 105
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 105:1-11
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị