Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ilu 8:18-36

Ilu 8:18-36 BIU

Ana m ekenye ụba na nsọpụrụ, na ikpe ziri ezi na ezi omume. Onyinye m na-enye dị mma karịa ọlaọcha, ọ karịkwara ọlaedo. Ana m aga ije nʼụzọ ezi omume, nʼokporoụzọ ikpe ziri ezi. Ndị niile hụrụ m nʼanya, na-eketa akụnụba. Ana m emejupụtakwa ụlọakụ ha. “ONYENWE ANYị kpụrụ m dịka mmalite ụzọ ya, tupu o bido ike ihe ọbụla ọzọ. Site nʼebighị ebi gara aga ka m dị; adịkwa m adị tupu e kee ụwa. Anọ m na-adị tupu e kee ogbu mmiri, tupu isi iyi ọbụla agbapụta mmiri nʼelu ụwa, tupu e kee ugwu ukwu na ugwu nta. E, amụọla m rịị tupu Chineke ekee ụwa na osisi niile, na aja niile dị nʼime ya. Anọ m ya mgbe o doziri mbara eluigwe nʼọnọdụ ya, mgbe ọ tụsara ha nʼelu ogbu mmiri niile; mgbe o hiwere mbara eluigwe, mgbe o mere ka isi iyi niile nke ogbu mmiri dị ike, mgbe ọ kpara oke nye osimiri ebe ọ ga-akwụsị, ka mmiri ya ghara ịgafe iwu ya, mgbe ọ kara akara ebe a tọrọ ntọala nke ụwa. Oge ahụ niile ka m na-anọ nʼakụkụ ya dịka onye ǹka. Ihe banyere m na-atọkwa ya ụtọ; ana m egwuri egwu nʼihu ya. Ihe niile o kere tọkwara m ụtọ, ụwa niile na ụmụ mmadụ! “Nʼihi ya, ụmụ m ndị ikom, geenụ m ntị; nʼihi na ndị niile na-eso ụzọ m na-enwe ọṅụ. Gee ntị na ndụmọdụ m ka ị bụrụ onye maara ihe, agbakụtakwala ndụmọdụ m azụ. Ngọzị dịrị mmadụ ahụ na-aṅa ntị nʼokwu m, onye na-anọ na nche nʼọnụ ụzọ m ụbọchị niile, onye na-anọ na-echere m nʼọnụ ụzọ ụlọ m; nʼihi na onye ọbụla chọtara m chọtara ndụ; ọ natakwala ihuọma nʼebe ONYENWE ANYị nọ. Ma onye na-enweghị ike chọta m na-emerụ onwe ya ahụ; ndị niile kpọrọ m asị hụrụ ọnwụ nʼanya.”