Gee ntị nwa m, nʼihe m na-ekwu. Gee ntị nke ọma. Doo ihe ndị a nʼuche gị mgbe niile; ka ha bamiekwa nʼime obi gị, nʼihi na ha bụ ndụ nye ndị chọtara ha, bụrụkwa ahụ ike nye mmadụ. Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya, nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile. Ka ụgha ọbụla ghara isi gị nʼọnụ pụta; kpọọ ịgha ụgha niile na okwu rụrụ arụ niile asị. Legide anya nʼihu ime ihe bụ eziokwu; atụgharịkwala isi gị ile ihe ọbụla. Leruo ije ụkwụ gị anya, doziekwa ụzọ gị niile ka ọ guzozie. Ewezugala onwe gị site nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe; si nʼihe ọjọọ wezuga ụkwụ gị.
Gụọ Ilu 4
Geere nke a ntị Ilu 4
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ilu 4:20-27
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị