Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke ONYENWE ANYị, ike agwụla gị ịnagide ịba mba ya. Nʼihi na ọ bụ ndị ONYENWE ANYị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba, dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba. Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe, onye nwetara nghọta. Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha, ọ bakwara uru karịa ọlaedo. Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi, ọ dịghị ihe na-amasị gị e ji atụnyere ya. Ndụ ogologo dị nʼaka nri ya; nʼaka ekpe ya ka akụnụba na nsọpụrụ dịkwa. Ụzọ ya bụ ụzọ dị mma bụrụkwa ụzọ udo. Amamihe bụ osisi nke ndụ nye ndị na-ejide ya aka, e, onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike ka ihe na-agara nke ọma. Ọ bụ site nʼamamihe ka ONYENWE ANYị ji tọọ ntọala ụwa; ọ bụkwa nghọta ya mere ka eluigwe dịrị ebe ọ dị. Esitere nʼihe ọmụma ya kewaa ogbu mmiri niile, igwe ojii na-atụdakwa igirigi.
Gụọ Ilu 3
Geere nke a ntị Ilu 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ilu 3:11-20
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị