Amamihe ga-azọpụta gị site nʼụzọ ndị mmehie, sitekwa na mmadụ ndị okwu ha jọrọ njọ, ndị hapụrụ ụzọ niile ziri ezi nke Chineke na-agbaso ụzọ niile nke ọchịchịrị, ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, nʼihi na mmehie ha na-atọ ha ụtọ. Ihe ọbụla ha na-eme gbagọrọ agbagọ, jọọkwa njọ. Ọ bụ naanị amamihe ga-anapụta gị nʼaka nwanyị akwụna, na nwanyị na-abụghị nwunye gị nke na-ekwu okwu nrafu. Onye na-ahapụ di ọ lụrụ nʼagbọghọ, nke chefuru ọgbụgba ndụ ọ gbara nʼihu Chineke. Ụlọ nwanyị dị otu a dị nʼokporoụzọ nke na-eduba nʼọnwụ na nʼọkụ ala mmụọ. Ndị ikom niile banyere nʼụlọ ha na-ala nʼiyi. Ha adịghị alọtakwa nʼokporoụzọ nke na-eduba na ndụ. Nʼihi nke a, ị ga-aga ije nʼụzọ ndị ezi omume, debekwa ụkwụ gị nʼokporoụzọ niile nke ndị ezi omume, nʼihi na ọ bụ naanị ndị ziri ezi ga-ebi nʼala ahụ, ndị na-enweghị ịta ụta ga-afọdụkwa nʼime ya. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ site nʼala ahụ, ọ bụkwa ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi ka a ga-ewezuga na ya.
Gụọ Ilu 2
Geere nke a ntị Ilu 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ilu 2:12-22
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị