Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ilu 2:1-11

Ilu 2:1-11 BIU

Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata okwu ọnụ m niile zobekwa iwu m niile nʼime obi gị, tọọ ntị gị nʼala nye amamihe, wepụta obi gị inwe nghọta. E, ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọmụma ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị, ọ bụrụ na ị na-achọ ya dịka i si achọ ọlaọcha maọbụ akụ nke zoro ezo, mgbe ahụ, ị ga-aghọtakwa ihe bụ ịtụ egwu ONYENWE ANYị chọtakwa ihe ọmụma nke Chineke. Nʼihi na ọ bụ ONYENWE ANYị na-enye amamihe; nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa. Ọ na-edebere ndị ụzọ ha ziri ezi nzube ọganihu, ọ bụ ọta nye ndị na-eje ije nʼizuoke. Ọ na-echebekwa ụzọ nke ndị na-eme ezi ihe na-agbaso, na-elekọtakwa ụzọ nke ndị hụrụ ya nʼanya na-agbaso. Mgbe ahụ ka ị ga-aghọta ihe ziri ezi na ihe dị mma na ezi ụzọ niile. Nʼihi na amamihe ga-enwe ọnọdụ nʼime obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụobi gị ụtọ. Izuzu zuruoke ga-echebe gị, nghọta ga na-eche gị nche.