Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ilu 19:15-29

Ilu 19:15-29 BIU

Umengwụ na-akpata oke ịrahụ ụra, onye ọfọ ogori ka agụụ na-agụ. Onye na-edebe iwu Chineke na-enweta ndụ, ma onye na-akpọ ya asị na-anwụ. Onye ọbụla na-egosi ndị ogbenye obi ebere na-ebinye ONYENWE ANYị ihe, ọ ga-akwụghachi ha nʼihi ihe ọma ha mere. Dọọ nwa gị aka na ntị mgbe ọ ka dị na nwantakịrị nʼihi na oge ahụ ka olileanya dị. Ma i meghị otu a, ọ bụ ndụ ya ka ị na-emebi. Onye oke iwe ga-anata nra so ya, nʼihi na ọ bụrụ na ị napụta ya, ị ga-anapụtakwa ya ọzọ. Gee ntị na ndụmọdụ a na-enye gị, nabata ịdọ aka na ntị. Nʼikpeazụ, ị ga-abụ onye maara ihe. Ọtụtụ atụmatụ dị nʼobi mmadụ; maọbụ uche ONYENWE ANYị ga-emezu. Obi ebere mmadụ na-eme ka a na-achọsi ya ike. Ọ ka mma ịbụ ogbenye karịa ịbụ mmadụ nke eziokwu ọbụla na-adịghị nʼọnụ ya. Ịtụ egwu ONYENWE ANYị na-eweta ndụ na ọṅụ, na nchebe site nʼihe mmerụ ahụ. Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri, ọ gaghị eweghachi ya ọ bụladị tinye nʼọnụ ya. Tie onye na-akwa emo ihe, onye na-enweghị uche ga-aghọ onye nwere ezi uche, baara onye nwere nghọta mba, ha ga-enweta ihe ọmụma. Ọ bụ nwa ahụ na-eweta ihere ga-ezu nne na nna ya ohi, maọbụ chụpụ ha site nʼụlọ ya. Nwa m ọ bụrụ na ị hapụ ige ntị na ntụziaka m, ị ga-esi nʼokwu ihe ọmụma kpafuo. Onyeama ụgha na-akwa ikpe ziri ezi emo. Ọnụ nke onye ajọ omume na-eloda ajọ ihe. Ndị na-akwa emo na ndị nzuzu ga-ata ahụhụ; a ga-etikwa ha ihe.