Onye na-enwe ndidi nwere ọtụtụ nghọta, ma onye obi ọkụ na-egosi enweghị uche ya. Ndụ dị jụụ na-eme ka ụbọchị mmadụ dị ogologo; ekworo na-eme ka o ree ure. Onye ọbụla na-emegbu onye ogbenye na-elelị Chineke kere ha anya, ma onye na-emere onye ogbenye ebere na-asọpụrụ Chineke. Ọ bụladị nʼọnwụ onye ezi omume nwere ebe mgbaba nʼime Chineke, ma ndị ajọ omume na-ala nʼiyi, mgbe mbibi bịara. Nʼobi onye nwere nghọta ka amamihe na-anọgide, ma ọ bụladị nʼetiti ndị nzuzu ọ na-eme ka amara ya.
Gụọ Ilu 14
Geere nke a ntị Ilu 14
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ilu 14:29-33
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị