Ụzọ ndị nzuzu nʼuche ha onwe ha ziri ezi, ma onye maara ihe na-aṅa ntị nye ndụmọdụ. Ndị nzuzu na-egosipụta iwe ha ọsịịsọ, ma onye nwere uche na-elepụrụ mkparị anya. Ezi onye akaebe na-ekwu eziokwu, ma ajọ onye akaebe na-ekwu okwu ụgha. Okwu ọjọọ na-agbawa obi dịka mma agha, ma ire onye maara ihe na-eweta ọgwụgwọ. Eziokwu na-eguzo ruo mgbe ebighị ebi, ma okwu ụgha anaghị adịgide. Aghụghọ na-ejupụta nʼobi na-eche ihe ọjọọ; ma ndị na-eme ka udo dị na-enwe ọṅụ. Ihe ọjọọ anaghị adakwasị onye ezi omume, ma ndị ajọ omume enwetala nsogbu ebe ọ dị ukwuu. ONYENWE ANYị kpọrọ egbugbere ọnụ nʼagha ụgha asị, ma ihe ndị kwesiri ntụkwasị obi na-amasị ya. Onye nwere uche na-edebe ihe ọmụma ha nye onwe ha, ma onye nzuzu na-agbasa enweghị uche ya nʼanwụ. Aka na-arụsị ọrụ ike ga-achị achị, ma umengwụ ga-akwụsị naanị nʼọrụ mmanye. Obi nke jupụtara na nchegbu na-ada mba, ma okwu ọma na-eme ka obi ṅụrịa. Onye ezi omume na-eduzi onye agbataobi ya, ma onye na-emebi iwu na-eduhie ha. Onye umengwụ adịghị ahụ anụ ọ chụtara na nta nʼọkụ, ma ndị na-arụsị ọrụ ike na-eri site nʼakụ ha nwetara nʼịchụ nta. Ụzọ nke onye ezi omume na-eduba na ndụ, nʼụzọ ahụ, ọnwụ adịghị ya.
Gụọ Ilu 12
Geere nke a ntị Ilu 12
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ilu 12:15-28
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo