Onye ọbụla na-ahụ ịdọ aka na ntị nʼanya na-ahụ ihe ọmụma nʼanya, ma onye na-akpọ ịba mba asị bụ onye na-enweghị ụbụrụ isi. Ezi mmadụ na-anata ihuọma site nʼaka ONYENWE ANYị, ma onye na-atụpụta atụmatụ ọjọọ ka ọ na-ama ikpe. Onye ajọ omume agaghị anọgide, ma apụghị ihopu onye ezi omume. Ezi nwanyị bụ ọṅụ na okpueze di ya, ma nwanyị na-eweta ihere dịka ire ure nʼọkpụkpụ di ya. Echiche obi niile nke onye ezi omume bụ ihe ziri ezi, ma ndụmọdụ onye ajọ omume jupụtara nʼaghụghọ. Okwu niile nke ndị ajọ omume bụ ihe na-eweta ọnwụ, ma okwu ndị omume ha ziri ezi na-anapụta ha. Ndị na-emebi iwu ga-ala nʼiyi, ma ndị ezi omume ga-eguzosi ike.
Gụọ Ilu 12
Geere nke a ntị Ilu 12
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ilu 12:1-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo