Egbugbere ọnụ onye ezi omume na-azụju ọtụtụ mmadụ afọ, ma ndị nzuzu na-anwụ nʼihi amamihe nke kọrọ ha. Ngọzị ONYENWE ANYị na-eme mmadụ ọgaranya, ọ naghị atụkwasị ya nsogbu. Ihe na-atọ onye nzuzu ụtọ bụ izube nzube ọjọọ; ma ihe na-atọ onye maara ihe ụtọ bụ inwe nghọta. Ihe ahụ onye na-emebi iwu nʼatụ ụjọ ya ga-abịakwasị ya, ihe onye ezi omume na-achọ ka a ga-enye ya. Mgbe oke ifufe na-emebi ihe, ndị na-emebi iwu ka ọ na-eburu; ma ndị ezi omume na-eguzosi ike ruo ebighị ebi. Onye umengwụ na-abụ ihe mgbu nye onyenwe ya; ọ dịka anwụrụ ọkụ nʼanya mmadụ maọbụ dịka mmanya gbara ụka nke na-ejiji eze. Ịtụ egwu ONYENWE ANYị na-enye ogologo ndụ, ma ọnụọgụgụ afọ nke onye ajọ omume na-adị mkpụmkpụ. Olileanya ndị ezi omume ga-abụ ọṅụ; olileanya ndị na-emebi iwu bụ naanị ihe efu. Ụzọ ONYENWE ANYị bụ ebe mgbaba nye ndị na-enweghị ịta ụta, maọbụ ịla nʼiyi nye ndị na-eme ajọ ihe. A pụghị iwezuga onye ezi omume, ma onye na-emebi iwu agaghị anọgide.
Gụọ Ilu 10
Geere nke a ntị Ilu 10
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ilu 10:21-30
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo