Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ọnụọgụgụ 23:1-15

Ọnụọgụgụ 23:1-15 BIU

Belam sịrị, “Wuoro m ebe ịchụ aja asaa nʼebe a. Kwadokwaara m oke ehi asaa na ebule asaa.” Balak mezuru dịka Belam gwara ya. Ha abụọ gburu otu oke ehi na otu nwa ebule nʼebe ịchụ aja asaa ahụ nʼotu na otu. Mgbe ahụ, Belam gwara Balak sị, “Guzoro nʼebe a nʼakụkụ aja gị ka m gaa nʼihu chọpụta ma eleghị anya ONYENWE ANYị ga-ezute m. Aga m agwa gị ihe ọbụla o kpughere m.” Ya mere, Belam rigooro nʼebe ọhịa na-adịghị. Chineke zutere ya nʼebe ahụ. Belam gwara ya sị, “Edoziela m ebe ịchụ aja asaa, gbukwaa otu oke ehi na otu ebule nʼelu ha niile nʼotu na otu.” Nʼoge a, ONYENWE ANYị tinyere Belam ozi nʼọnụ sị ya, “Laghachi gaa zie Balak ozi a.” Mgbe Belam lọghachiri ọ hụrụ ya ka o guzoro nʼakụkụ ihe aja ya ndị ahụ, ya na ndịisi Moab niile. Nke a bụ ozi Belam ziri: “Balak esitela nʼobodo Aram kpọta m. Eze Moab esitela nʼọwụwa anyanwụ nke ugwu ahụ kpọta m. Ọ sịrị m, bịa bụọrọ m Jekọb ọnụ bịa kwutọọ Izrel. M ga-esi aṅaa bụọ onye Chineke na-abụghị ọnụ ọnụ? M ga-esi aṅaa kọchaa onye ONYENWE ANYị na-akọchaghị? Esitela m nʼelu nkume ndị a hụ ha. Elegidere m ha anya site nʼugwu ahụ, hụ na ha bụ ndị biri onwe ha, ndị dị iche site nʼetiti mba niile ọzọ. Onye pụrụ ịgụta ole uzuzu Jekọb dị? Maọbụ gụta ole otu ụzọ nʼime nkewa anọ nke Izrel dị. Ọ ga-atọ m ụtọ ịnwụ ụdị ọnwụ ndị na-eme ezi omume. Ka ọgwụgwụ ndụ m bụrụ ihe nwere ike iyi nke ha!” Balak sịrị Belam, “Gịnị bụ ihe a i mere m? Akpọtara m gị ka ị bụọrọ m ndị iro m ọnụ, ma ugbu a, ọ dịghị ihe ọzọ i mere karịa naanị ịgọzi ha!” Ma Belam zaghachiri sị ya, “Ọ bụghị ihe ONYENWE ANYị tinyere m nʼọnụ ka m ga-ekwu?” Mgbe ahụ, Balak sịrị ya, “Soro m bịa nʼebe ọzọ ebe ị ga-ahụ ha; ọ bụ naanị nsọtụ ọmụma ụlọ ikwu ha ka ị ga-ahụ, ị gaghị ahụ ha niile. Site nʼebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.” Ya mere, eze Balak duuru Belam gaa nʼọhịa Zofim, nʼelu ugwu Pisga, wuo ebe ịchụ aja asaa nʼebe ahụ. O jikwa otu oke ehi, otu oke ehi, na otu ebule, otu ebule, chụọ aja nʼebe ịchụ aja ndị ahụ. Belam sịrị Balak, “Guzoro nʼebe a nʼakụkụ ihe aja gị, ebe mụ onwe m ga-ezute ya nʼofe nke ọzọ.”