Ọ sịrị ha, “A na-ebute oriọna ka e jiri efere kpuchie ya maọbụ dọnye ya nʼokpuru akwa ndina? Ọ bụghị ka a dọba ya nʼelu ihe ịdọba iheọkụ? Nʼihi na ihe niile e zoro ezo ga-apụta ihe ma ihe niile e kpuchiri ekpuchi ka a ga-emesịa kpughee. Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.” Ọ sịrị ha, “Kpacharanụ anya ihe unu na-anụ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu, maọbụ karịa. Onye nwere ihe ka a ga-enye karịa; onye na-enweghị, ọ bụladị nke o nwere ka a ga-anapụ ya.”
Gụọ Mak 4
Geere nke a ntị Mak 4
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Mak 4:21-25
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị